NDỊ mmadụ bi n’ụlọelu okpukpu atọ nke dara na 22 Nkisi Aloli Street, Onitsha, steeti Anambra na-ekele Chineke maka ịzọpụta ha na nnukwu ọdachi ahụ. Ụlọelu ahụ nke dị n’akụkụ nnukwu mbize dara ka mmiri zoro ihe dịka awa asaa.
E kwuru na ọ bụ nwata nwoke gbara afọ isii ka Chineke ji rụọ ya bụ ọrụ ebube. Nwata ahụ chọpụtara n’ihe dịka mgbe o jiri ọkara gaa elekere isii nke ụtụtụ na osisi mango dị n’azụ ụlọ ahụ adịzighị ya, o wee kpọtụrụ nne ya onye nke si na windo lepụ anya wee chọpụta na osisi ndị ozọ di n’akụkụ ụlọ ahụ adaala.
Nke a mere ka nne nwata ahụ malite tibe mkpu nke mere ka ndị niile bi n’ụlọ ahụ gbapụtachaa. Ozugbo ha pụtachara, ụlọ ahụ daa pịatapịata. Onweghị onye nwụrụnụ, ma onweghịkwa onye ji ihe ọ bụla gbapụta.
Chima Ikemefuna, otu onye na ndị bi n’ụlọ ahụ dara ada kwuru na Chineke si n’aka nwata nwoke ahụ zọpụta ha. Ọ gakwara n’ihu sị, “Dịka Chineke sị chọ ya, onweghị onye n’ime anyị merụrụ ahụ mana anyị tufuru ihe niile anyị nwere. Ihe anyị ji gbapụta bụ sọọsọ akwa anyị yi n’ahụ. Atụfuru m asambodo m niile. Ụlọ ahụ dara otu nkeji anyị ji gbapụtacha na ya. Anyị kelere Chineke maka ịzọpụta ndụ anyị.”
Ikemefuna kpọkụkwara ndị ọchịchị etiti na nke steeti ka a gbatara ha ọsọ enyemaka. Onyeisioche ọchịchị Onitsha ‘North’ Maazị Patrick Agba-Mba onye bịara ebe ụlọ ahụ dara katọrọ otu ndị nwe ụlọ (landlords) sị arụnye ụlọ n’ọdọ mmiri na akụkụ mbize. Ọ takwara ndị na-akwụ ha ụgwọ wee ga biri n’ụdị ụlọ ahụ (tenants) ụta.
O kwuru na ndị State Emergency Management Agency (SEMA) abịala ebe ahụ maka ikpocha ya, iji mara ụzọ a ga-esi nyere ndị o metụtara aka. Agba-Mba kpokuziri ndị bi n’ụlọ abụọ ọzọ dị n’akụkụ ụlọelu ahụ dara ad aka ha kwakọrọ ngwongwo ha pụọ ozugbo tupu ihe riri ụtara arachakwuo ofe.