NAPTIP adọọla aka na ntị banyere alụmdi site n’ụzụ ihe ọyị social media

0
48

A DỌỌLA ndị ntorobịa aka na ntị ka ha kwụsị itinye onwe ha n’alumdi site n’ihe ọgbara ọhụrụ ọnyanwudude (social media).

 

Ọ bụ onyeisi The National Agency for the Prohibition of Trafficking in Person (NAPTIP) Oriakụ Julie Orkah-Donli kwuputara nke a oge o wụchara na Iruekpen Mixed Secondary School, Iruekpen; nke dị n’okpuru ọchịchị Esan na steeti Edo.

 

Orkan-Donli kwuru na ndị na-atụ mgbere mmadụ na-esite n’ụzọ alụmdi dị otu ahụ wee na-akpọpụ ụmụnwaanyị maka ịgba akwụnakwụna (ashawo). Ọ dụkwara ụmụakwụkwọ ọdụ ka  ha gbaara oke ịlụ di n’oge ọsọ, ọ kachasị mgbe he erubeghị afọ iri na asatọ; ma gwakwa ha mkpa ọ dị iji aka ha họrọ onye ha na ya ga-alụ di na nwunye.

 

Onyeisi NAPTIP ahụ gakwara n’ihu kwuo na ụzọ ndị ọzọ ndị ọjọọ ahụ sị enweta ndị ha ji atụ mgbere gụnyere ikwe nkwa ịbanye n’ịgba bọọl, iji onye ahụ gosi ihe dị mma dịka akwa (modeling), njem (pilgrimage). O kwuru na ọnọdụ iji mmadụ atụ mgbere na-ebute ọnwụ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ma kwukwaa na ihe ndị na-akpata ya gụnyere ogbenye, agụghị akwụkwọ, oke ọchịchọ w.d.g.

 

Ọ gakwara n’ihu kọwaa na e wepu idubanye ndị ahụ a tụrụ mgbere n’ịgba ashawo, na mgbe ụfọdụ a na-ebekọrọkwa ihe ha ji bụrụ mmadụ (organs). Ọ dọzịrị ụmụakwụkwọ aka na ntị ka ha jụ ịnabata atụmatụ onye ọbịa ọ bụla na-ekwe ha nkwa ịkpọpụ ha obodo oyibo.

Orkah-Donli dụrụ ha ọdụ ka ha mee njem ala bekee site na nkwado nke nne na nna ha, ya na maka atụmatụ dị mma.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here