OMENALA pụtàrànnọọ ihè n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra na nso-nso a, dịka ụmụakwụkwọ Mahadum Nnamdị Azikiwe mere mmemme Ojiọfọr, bụkwa mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2019.
Oke emume ahụ bụ ótù n’ime mmemme e jiri merùbe izu ụka ụmụakwụkwọ nke ahọ a na mahadum ahụ, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu sònyèrè na ya, nke gụnyere: onyeisi ụlọ ọrụ ‘Spine Communications Ltd.’, bụ Maazị Emeka Okeke; onyeisi na-ahụ maka mgbasa ozi na mmekọrịta ọhanaeze na mahadum ahụ, bụ Dọkịta Emma Ojukwu;
onyeisi na-ahụ maka ụmụakwụkwọ, bụ Ọkammụta Stanley Udedị; onyeisi ụlọ mgbasa ozi Anambra Broadcasting Service, Maazị Uche Nwọrah, tinyere onyeisi ọmụmụ ihe ‘Confuscius Institute’, bụ Ọkammụta Yu Zhargbao, na ọtụtụ ndị ọzọ.
N’okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi ụlọ ọrụ ‘Spine Communications’ kọwara mmemme ahụ dịka nke dabàrà adaba na mbọ ahụ a na-agba ịkwàlite omenala, ọdịnala, ọnatarachi, na njirimara Ndị Igbo n’ebe ụmụakwụkwọ na ụmụ na-eto eto nọ, n’ihi na nke ahụ bụzịkwa ihe na-achọ ịnyụ ka ọkụ ugbua.
Dọkịta Okeke chetààrà ndị bịara mmemme ahụ maka mkpebi ahụ onyeisi mahadum ahụ, bụ Ọkammụta Charles Esimone mere nso-nso a na ọ ga-ebuli ya bụ ụlọ mmụta ka soro na mahadum narị abụọ kacha mma na mba ụwa gbaa gburugburu, ma kwuo na ụlọ ọrụ ya ga-aga n’ihu ịkwàdò ihe dị iche-iche a na-eme na ya bụ mahadum, iji mee ka ya bụ ebumbobi bụrụ nke pụtara ìhè; ọbụnadị dịka o kèlèrè ụmụakwụkwọ hụ maka ijikọta onwe ha ọnụ wee chịkọba ya bụ oke mmemme.
Na mbụ n’okwu ya, onyeisi otu jikọtara ụmụakwụkwọ bụ ‘Students Union Government’ (SUG) na mahadum Nnamdị Azikiwe, bụ Maazị Joseph Okafor mere ka a mara na mmemee Ojiọfọr bụ mmemme ha na-eji wee na-egosipụta ịma mma nke ọnatarachi ndị Igbo, ma sitekwa n’ụzọ dị otu ahụ na-akwalite asụsụ na omenala Igbo na gburugbúrù mahadum ahụ.
O kwukwàrà na mmemme ahụ ga-enye aka ichetara ụmụakwụkwọ Igbo na-aga na Unizik ebe ha si, n’agbanyeghị ebe ọ sọkwara onye ọ bụ ya nọrọ tòó; ma kelekwazie ndị dị iche-iche bịara isonyere ha na ya bụ mmemme maka, dịka ọ kpọkùrù ụmụakwụkwọ ahụ ka ha were ihe ha mụtàrà na mmemme ahụ kpọrọ ihe ma burukwa ya bụ oziọma banyere ịkwàlìte asụsụ na omenala Igbo wee bàá na nglaba mmụta ha dị iche iche.
Na ntụnye nke ya, otu onye selitere isi n’ụlọ ọrụ ‘GUO Motors’ bụ Maazị bụ onye nọchitere anya ụlọ ọrụ ahụ dịka otu n’ime ndị kwadoro mmemme ahụ, bụ Maazị Bernard Nweke kwàrà àrịrị na ọtụtụ ndị ntorobịa Igbo na-agbakụtazị asụsụ na omenala Igbo azụ, n’ihi na ha na-etinyezị uche n’ihe ọgbara ọhụụ ma na-enwekwa mmasị n’omenala ndị ọcha, ma kwuo na ọ bụ nke ahụ ka o jiri dị mkpa na a ga na-akwàdo ma na-achịkọba ụdị ihe mmemme ahụ na mgbe na mgbe, iji chetara ha na omenala Igbo adịlarịị na mbụ tupu ihe ndị ahụ malit ịpụta.
O kwùrù na ụlọ ọrụ GUO bụ ụlọ ọrụ ihe gbasaara ịkwalite omenala na-amasị nke ukwu, ma kwekwazie nkwà na ha ga-aga n’ihu ịkwàdò ihe mmemme dị otu ahụ, ọbụnadị dịka ọ kpọkuru ụmụakwụkwọ ahụ ka ha na-asụsi asụsụ Igbo ike n’ụlọ akwụkwọ ahụ oge ọbụla n’agbànyèghị ngalaba ọmụmụ ihe onye nọ na ya; n’ihi na ọ bụ site n’ụzọ dị otu ahụ, dịka o siri kwuo, ka a pụrụ isi chekwaba, kwalite ma mee ka asụsụ Igbo dị ọkpụtọrọkpụ.
A nọrọ na mmemme ahụ gbaa mgba site n’aka ụmụakwụkwọ ahụ, sọọ mpi egwuregwu, mee ọtụtụ ihe ngosi, gbaa egwu, ma riekwa ji ọhụụ na ọtụtụ erimeri ndị Igbo dị iche iche, iji me ka ya bụ mmemmee zaa aha a kpọrọ ya.