NDỊ ụlọ nzukọ omebe iwu etiti (Member of the House of Representatives) ekpebiela ịhọpụta onyeisioche nke ụgbọelu Air Peace bụ Allen Onyema maka nkwanye ukwu ala Nigeria (National Award).
Ha kpebiri ime nke a ka ndị ọrụ ụgbọelu Air Peace bulatachara ndị Nigeria site na Johannesburg, South Africa n’ihi mwakpo a wakporo ndị ọbịa (xenophobic attacks) na mba ahụ.
Onye okwuputa okwu ụlọ nzukọ ahụ bụ Femi Gbajabiamila arịọla minista na-ahụ maka ihe banyere mba ọzọ (Foreign Affairs) Geoffrey Onyeama ka ọ za oku nke otu (House Committee) maka ihe gbasara mba ọzọ kpọrọ ya maka nkọwa zuru oke. O kpebikwara iji ya bụ atụmatụ gakwuru onyeisi ala, President Muhammadu Buhari.