Too ndị okenye anọ maka ọrụ ha na nta akụkọ
NDỊ otu National Light ArtHouse, bụ ngalaba Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Extra nọ na Tuzdee abalị mbụ nke ọnwa Oktoba mee mmemme iji cheta nwere onwe ala anyị bụ Nigeria.
Emume a kpọkọtara ọtụtụ ndị ọnụ ruru n’okwu n’ụlọ ezumezu ANPC bụ ebe ọ nọrọ kpọtụọ. Onyeisi ụlọọrụ ANPC bụ Sir Chuka Nnabuife ji obi aǹụrị nabata ndị mmadụ. O kwuru sị na ya bụ onye na-akwalite ọnatara chi nke mmadụ nwere, n’ihi na ọ bụghị ihe a na-ezo ezo. Ọ rụtụrụ aka n’Akwụkwọ Nsọ ebe e kwuru na anaghị ezo ya ezo.
Nnabuife gara n’ihu kwuo na ọtụtụ ọnatara chi ndị otu ‘ArtHouse’ ahụ bụ n’ụlọ ezumezu ANPC ka a nọrọ wee chọpụta ha. A nọrọ n’emume ahụ gosipụta ọrụ ǹkà (art work) dị iche iche, ejije, egwu ifo, ukwe, w.d.g. E nwekwara nkụzi n’ọtụtụ isiokwu.
A nọkwa na ya tube mmadụ anọ ugo maka ọgbụgba afọ ha n’elu ụwa. Ha bụ Jude Okey Emecheta, onye gbara afọ iri isii na otu; Stanley Egbochukwu, afọ iri asaa; Tony Otikpa gbara afọ iri isii na ise na Nobel Paul Nwosu bụ onye gbara afọ iri isii. Ka a gụpụtachara akụkọ ndụ ha, e kpeere ha ekpere; ka nke ahụ gachara, ha wara achịcha wee yọrịkwaa egwu a gụụrụ ha.
Sir Nnabuife kelere Chineke n’isi ụmụnwoke anọ ahụ wee kwuo na ọ na- meere ha ncheta ọgbụgba afọ ahụ iji wee jaa ike. N’okwu nke ya, Sir Jude Emecheta bụ otu n’ime ndị ahụ e chetara ọgbụgba afọ ha kelere ndị isi ANPC maka nkwanye ugwu ahụ a kwanyeere ha, ma kwuo na olile anya ya bụ na afọ ọzọ na ha ga-enye nkwado ha maka ụdị mmemme ahụ.
N’ajụjụ a jụrụ ya gbasara ala Nigeria, Emecheta kwuru si na dịka ala anyị gbara afọ iri ise na iteghete na ọ bụ nwata mana ọbụghịzi nke otu ahụ. Ọ rụtụrụ aka n’ọtụtụ afọ mba America na China gbarala wee kwuo na Nigeria kwesịrị iji ego mee ihe kara baa uru n’oge a nọ n’afọ (70’s); bụ mgbe mmanụ na-agbọ n’ala anyị.
Otu o sila dị, Emecheta kwuru na olile anya dị; na ihe dịka afọ iri na ise na-abịa a ga-enwe ezi ọganihu karịa ka ọ dị ugbu a. Ọ rụtụrụ aka sị na ọchịchị ndị agha so n’ihe dọchighara ala Nigeria azụ. Barr Harry Udu, bụ onyeisi ọrụ (Head of Service) na steeti Anambra kwuru na ala Nigeria kwesịrị ika mma karịa ka ọ dị ugbu a n’ihi na o nwere ihe akụ akụ na ihe enwe enwe. Mana otu o dila, ọ kọwara na olile anya ka dị n’ihi na ọ ka nwere ihe ndị ahụ Chineke jiri gozie ya.
Udu gakwara n’ihu dụọ ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha nwee ndidi maka na afọ iri ise na iteghete ka dị obere; ma kwuo na mba America na Britian agbaala ọtụtụ afọ. Ndị bịara mmemme ahụ gụnyere Chido Obidiegwu, Fanny Oguine, Mitchelle Onugbolu, Beatrice Nnabuife, Nkechi Udeze, Maureen Obindu, Bob-Manuel Udokwu w.d.g.
Ndị Ibeto Group, ngalaba na-emepụta mmanụ (Ibeto oil and Lubricants) kere ihe onyinye akwụkwọ na mkpịsị odee.