IGBO sị na okpueze na-adị mma n’isi onye o rùrù, ma sịkwa na ùgwù na-adị mma ịkwanyere onye o kwèsìrì. Ka ọ dị taa, gọọmenti steeti Anambra ekwuwaala na abalị iri na isii nke ọnwa iri na ótù ahọ ọbụla ga na-abụzị ụbọchị ezumike n’iji kwanyere onyeisi ala mbụ chịrị Nigeria ùgwù, bụ Dọkịta Nnamdị Azikiwe lagoro mmụọ, dịka ọ bụ n’oke ụbọchị ahụ ka a mụrụ ya bụ agụ nwoke a maara dịka Zik nke Afrịca.
Ọ bụ aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kwupùtàra nke a nso-nso a na mmemme ichèta ụbọchị ala Nigeria nweere onwe ya pụọ na ọchịchịndị ọcha, bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee merùbe ọgbụgba ahọ iri ise na iteghete nke ala Nigeria.
O tòrò ndụ nwa amadi ahụ na ezi agbambọ ya dịka onyeisi ala Nigeria, nakwa ihe dị iche iche o mepụtàgàsịrị malite n’oge a na-alụ ọgụ ime ka ala Nigeria nwere onwe ya pụọ n’aka ọchịchị ndị ọcha, ma sịkwazie na ihe ndị ahụ niile na ụdị oke mmadụ ahụ ekwesighị ka e chezọọ, gbakụta ha azụ ma ọ bụ leghàra ha anya, bụkwazị nke mere e jiri mapụta ụbọchị ahụ dịka ụbọchị ezumike n’ịkwanyere ya ùgwù na iji tụgharị uche na ndụ ya na ihe o mepụtaara ala Nigeria.
Ka ọ na-agụpụta ozi onyeisi ala Buharị maka oke ụbọchị mnwere onwe ahụ, Gọvanọ Obianọ, onye jiri ụdị ejiji Maazị Azikiwe jìrì n’ama egwùregwu Tafawa Belewa n’ahọ iri ise na iteghete gara aga kwupụtara ezi olileanya o nwèrè na ala Nigeria ga-agabigacha ma nweta mmeri n’ihe iche aka mgba niile a chere ya n’ihu ugbua, ma ọ bụrụ na ụmụafọ Nigerie ga-ejikọ aka ọnụ wee kwàdo ma mee ka ezi ọchịchị guzosie ike.
Ọ gara n’ihu kwuo na steeti Anambra na-agawanye n’ihu ma na-emekwa nke ọma na ngalaba dị iche iche, ma a tụlee ya na steeti ndị ọzọ dị n’ala Nigeria, nke mezịrị ka ya bụ steeti bụrụ ihe nlere anya nyere steeti ndị ọzọ, ma kwekwazie nkwà na ọchịchị ya agaghị ada mbà n’iwètara ụmụafọ steeti ahụ ezi ọchịchị.
Oke mmemme ncheta ụbọchị mnwere onwe ahụ dọtara imirikiti ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na ndị ọnụ na-eru n’okwu na ngalaba niile nke steeti ahụ, nke gụnyere: Òsòtè aka na-achị steeti ahụ, bụ Dọkịta Nkem Okeke; ọkaokwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafọr; ọkaikpe ukwu steeti ahụ, bụ Ọkaiwu Ọnọchie Anyachebelụ; odeakwụkwọ ukwu steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ, Onyeisi oche òtù ndọrọ-ndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance (APGA)’ Maazị Victor Oye, tinyere ndị eze ọdịnala, ndị omebe iwu, ndị isi ụka, ndị ọkà mmụta na ọtụtụ ndị otu dị iche iche.
A nọkwara na ya bụ mmemme wee mee ịkwụ n’ahịrị na ife aka bụ nke e mere site n’aka ụmụ akwụkwọ na òtù ọrụ dị iche iche, tinyere egwu ọdịnala a gbara na ihe nkiri ndị ọzọ e mèrè, iji me ka oke ụbọchị ahụ zaa ahà a kpọrọ ya.
A mụrụ Dọkịta Nnamdị Azikiwe, bụ ezi nwa afọ steeti Anambra n’abalị iri na isii nke ọnwa iri na otu ahọ 1904, ma ọ chịrị Nigeria dịka onyeisi ala mbụ oge ya bụ ala nwerechara onwe ya pụọ n’aka ọchịchị ndị ọcha; ma ọ nwụrụ n’abalị iri na otu nke ọnwa Méè ahọ 1996.