ỌDACHỊ dapụtara na Monde n’Asaba isi obodo steeti Delta dịka otu onye uweojii gbagburu onye ọrụ uweojii ibe ya oge ha gara igbochi ngagharị iwe (protest) nke ụfọdụ ndị ahịa na-eme n’okirikiri Bonsaac.
Onye uweojii nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ ka e kwuru na o so n’ime ndị uweojii anọ e zipuru site na ‘B’ Division ka ha gaa ọrụ n’ebe ahụ a na-eme ngagharị iwe. Ọ nwụrụ ozugbo ebe ahụ n’ihi mgbọ (stray bullet) nke otu onye n’ime ha gbara.
E kwuru na ihe kpatara ngagharị iwe ahụ bụ n’ihi ọdụ ahịa ụmụnwaanyị nke a kwatuchara n’ebe ahụ. Ụmụnwaanyị ahụ bụ ndị nọ n’obosara ala ha na-akwụ ụgwọ nke a dọnyechara akpati kọntena wee na-agba mbọ onwe ha.
Ụmụnwaanyị ahụ siri ọnwụ ka a kwatuchara ahịa ha wee kwuo na a ga-akwatukwa ọdụ ahịa ndị dị na nke onye nọ n’isi ihe ahụ na-emenu; onye e nyere aha ya dịka Maazị Bidi. Ha siri ọnwụ ahụ n’ihi na ha kwuru na nwoke ahụ sị na ikike e jiri kwatuo ọdụ ahịa ndị ahụ si na ngalaba na-ahụ maka gburu gburu (Ministry of Environment) nke steeti ahụ.
Ka ọ dị ugbu a, onye uweojii ahụ gbara egbe nke gburu mmadụ nọzị na nke ndị ọ dị n’aka, State Criminal Investigation Department (SCID). Kọmịshọna ndị uweojii na steeti Delta bụ Adeyinka Adeleke kwuru na onye uweojii nwaanyị ahụ nwụrụ n’eziokwu, ma kọwaa na okwu nọzị n’aka ndị SCID maka nnyocha.