NDỊ ụka, tinyere ndị bi n’okirikiri Omagba Phase One Layout, Onitsha nke dị na steeti Anambra emeela ngagharịiwe udo n’ihi mmetọ nke megidere ahụike mmadụ site n’aka ndị nweụlọ (landlords) bị n’ebe ahụ.
Ndị nweụlọ ka e kwuru na ha na-akwara okporo (pipe) na-ebu nsị wee na-etinye ya isi n’ọwa mmiri n’enweghị ụzọ ọbụla ha si amịpụ nsị ahụ.
Ndị chịkọbara ya bụ ngagharịiwe bụ ndị Justice, Development and Peace Caritas (JDPC), archidayọsis nke Onitsha bụ ngalaba na-ekwupuru ndị mmadụ maka ọdị mma ha n’ụka Katọlik. Ha tiri mkpu banyere ahụike ụmụakwụkwọ na ndị ụka Holy Spirit Catholic Church, Omagba bụ ndị nke mmetọ (pollution) ahụ kacha metụta.
Ndị bu ụzọ na ngagharịiwe ahụ bụ ndị Sista (Rev Sisters). Ha na ndị mmadụ bucha ihe e dere n’obosara akwụkwọ iji katọọ ihe ọjọọ ahụ.
Ha nọ na-agụ, na ekwupụta ihe dị iche iche iji kwado ezi mkpocha, ịmịcha nsị na ịdị ọcha dịka ha na-agagharị n’ogbe ahụ.
Ihe ha dere were na-agagharị gụnyere; “Ịhapụ nsị ka ọ na-abanye n’ọwa mmiri bụ njọ megide mmadụ.” “Adịmọcha na-ebute ịchọta ihu Chukwu.” “Kwụsị imetọ gburugburu,” “kwụsị imetọ ikuku, ọ na-ekesa ọrịa,” na ọtụtụ ozi ndị ọzọ.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, Ọkammụta na ngalaba na-amụ maka iwu (Law) Rev Sista Ann Obiora kwuru na ndị bi n’okirikiri ahụ abụrụla ndị nke a hafere n’aka nsogbu ọrịa dị iche iche (epidemic) ọ kachasị ndị bi n’okporoụzọ Olo bụ ebe e ji nsị wee metọchaa.
Dịka o siri kwu, ịkwanye nsị n’ọwa mmiri ọha na eze katama n’olulu ebe o kwesịrị na-ebute nnukwu nsogbu ahụike n’ebe ndị bi n’ogbe ahụ nọ.
Sista Obiora kọwakwara sị; “Ihe niile banyere JDPC bụ ịhụ na ihe na-aga dịka o kwesịrị. Anyị na-ekwupụta nke a maka na e metọọla gburugburu a, nke na-erute n’ụlọakwụkwọ Katọlik anyị ebe anyị na-azụlite ụmụaka maka ịbụ ezigbo mmadụ n’obodo.Ụlọakwụkwọ ọtaakara, prịma na sekọndịrị dị ebe a nọzị na nsogbu n’ihi oke isi nke ekweghị odidi;
ebe ụmụaka nọ n’ụlọakwụkwọ na-ada ọrịa ma ha kuruchaa isi ọjọọ ahụ. Anyị niile nọ na nsogbu, tinyere ndị nkuzi, nke a bụ njọ ma megide mmadụ. Anyị na-eti mkpu ka e mee ngwa ngwa wee meghara ọdachị.”
Sista ahụ gara n’ihu kwuo na ịmetọ gburugburu na-ebute ọnwụ ndị mmadụ.
Onye ọrụ ahụike dị n’ụlọụka ahụ bụ Oriakụ Chinwe Okoyeuzu kwuru na ọnọdụ ahụ abụrụla ihe iche aka mgba nye ụmụnwaanyị dị ime na ndị na-enye nwa ara bụ ndị na-abịa n’ụlọ ahụike (health centre) n’ebe ahụ.
Onyeisioche JDPC Holy Spirit Parish Omagba bụ Jonas Ogbuke kọwara na JDPC enyela goomenti steeti Anambra mkpesa maka nsogbu ahụ mana ha anatabeghị ụsa n’aka ha.