ỌTỤTỤ ndị mmadụ ka nọ n’oke egwu n’ihi ọkụ ọgbugba ahụ kpara mkpamkpa n’Onitsha, Steeti Anambra n’izuụka gara aga.
Chukwudi Okeke bụ onye agbataobi Oriakụ Ifeoma Nwoye, nwaanyị ahụ ọkụ gbagburu ya na nwa ya n’ahịa Ochanja gwara ndị nta akụkọ na nwaanyị ahụ nọrọ n’amụghị nwa afọ iri na isii ọ lụchara di. Ọ kwuru na ọ bụ na mmalite afọ a bụ 2019 ka ọ mụrụ nwa ahụ ọkụ gbagburu ya na ya.
Gbasara otu ọdachi ahụ siri me, Okeke kwuru sị; “Nwaanyị ahụ agbapụtala n’ụlọ ahịa ya (na nwa ya) mana ọ nọkatara lachigha azụ. Ọ bụ mgbe ọ na-achọ ịgafe ka ọ dabanyere n’ọwa mmiri ahụ na-agba ọkụ, ya na nwa ya wee gbaa ọkụ.”
Okeke gara n’ihu kọwaa sị na ha nọ n’ebe ha na-azụ ahịa we nụ maja ọkụ na-agba n’Upper Iweka. Na ọ bụ eziokwu na ha hụrụ anwụrụ ọkụ n’ebe tere aka mana ha amaghị na ọ ga-eru n’ebe ha nọ. O kwuru sị; “Anyị nọ na-anụ isi mmanụ ọkụ petrol dịka a gwakọtara ya na gas n’ebe tere aka, ọ nọ na-aga n’ọwa mmiri wee ruo mgbe o nwuuru ọkụ.”
Ka ihe siri dị, ndị ahịa na-ahazi ebe ọkụ gbara na-akọwa na ka ụbọchị ahụ gachara a hụkwara ọtụtụ ozu ndị mmadụ n’ụlọ ahịa dị iche iche n’ahịa Ochanja ahụ.
E kwuru na e butere ozu ụmụagbọghọ abụọ (sales girls) n’otu ọnụ ụlọ ahịa.
Otu nwa ikorobịa ka a hụrụ ozu ya n’otu ọnụ ụlọ ahịa, mana ọ gbaghị ọkụ, ahụ ya niile zuru oke. A na-akọwazi na eleghị anya na ọ ga-abụ ekuteghị ume nkeọma gburu ya.
Ka anyị cheta na ka ya bụ ihe mechara, aka na-achị steeti Anambra bụ Willie Obiano wụchara ozugbo tie ndị ihe mere aka n’obi.
Gọvanọ Obiano kwere nkwa inye nkwado maka akwamozu ndị lara mmụọ ma kwekwa nkwa inyere ndị tufuru akụ na ụba ha aka.
N’otu aka ahụ kwa, o kwere nkwa ileba anya n’ihe gbasara ngalaba na-ahụ maka ọkụ ọgbụgba iji hụ na ha nwechara ihe niile ha ji arụ ọrụ.