OTU nwaanyị aha ya bụ Susuan Gudi egbuola di ya bụ James Gudi ma bepụ ya amụ ya. Ihe ọjọọ a na-awu oyi bụ nnọọ nke mere n’Uke na Karu dị na Steeti Nasarawa. Nwaanyị a bụ onye gbara afọ iri atọ na atọ, na nkwupụta ya ọgọghị agọ.
Ọ siri na ya na di ya malitere alụm di na nwunye ha nkeọma, na Chukwu nyere ha ụmụ abụọ. Ọ siri na mgbe ha malitere ịlụ di na ọ dị ka ọ bụ mmekọ di na nwunye ka o bu n’obi wee lụta ya. Ọ siri na ha enweghị oge iche na ọ bụ mgbe ọbụla ma ebe a na- awụ ahụ, ebe ya na-esi nri, ebe ọbụla o kpadoro ha ka ha na-enwe mmekọ.
Dịka o siri kwu, nsogbu malitere mgbe ha mụchara nwa nke abụọ ya chọpụtazie na di ya adịghị eme ka o si emebu n’akwa; site n’inwe mmekọ ugboro abụọ n’otu izuụka o ruo na ha na-anọ ọnwa atọ ma ọ bụ anọ n’enweghị mmekọ.
Na ya ejighị ya kporo ihe maka na ọ siri na ọ ga- alaghachi ka o si eme na mbụ. Emesia mgbe ọbụla ya bịakwụtere ya ka ha nwee mmekọ, ọ jụ, ọ sị na ya achọzighi idi na-enwe mmekọ. Malite mgbe ahụ ya kpesaara onye ụkọchukwu ha ma di ya egeghị ụkọchukwu nti. Ya kpesara nne na nna di ya ma di ya egeghị ntị ;na ya kpesakwaara ma ndị ikwu na ibe ha mana o geghị ntị.
Gudi kwukwara sị na ihe gbawara ya obi bụ na ya chọpụtara na di ya na ezi enyi ya bụ Victoria na-eme enyi, ọzọkwa na ya hụrụ n’ekwe nti di ya edemede Victoria detaara di ya na-ekele ya maka mmekọ ya na ya nwere. O kwuru na ọ bụ nke a gbawara ya obi ya jiri tinyere ya ọgwụ na nri na mmiri, na ihe ya jiri bepụ ihe o jiri bụrụ nwoke bụ na ọ bụ ihe ahụ mere o jiri na- aghọgbu ya kamgbe.
N’ezie, ọ bụrụ na agwa ntị ma ọnụghị, e bepụ isi ntị esoro ya. Ọzọ ijiji anụghị ihe na-eso ozu ala mmụọ. Ihe ndị nta akụkọ ji ede ụfọdụ ihe na-eme n’oge a bụ ka ndị dị ndụ mụrụ akọ