KA Ọ gachara ihe dịka afọ abụọ a chụchara ọrịa ọjọọ nke a na-enweta site n’anụmanụ (monkey pox) ọsọ n’ala Nigeria, ya bụ ọrịa ka a na-akọwa na ọ wụchaala ọzọ n’obodo anyị.
N’oge ahụ ya bụ ọrịa dị, ndị Nigeria sọrọ nsọ iri anụ, ọ kachasị anụ ndị bi n’ime ọhịa. Ma dịka o si dị ugbu a, egwu jikwa ọtụtụ ndị mmadụ makana ọrịa ahụ agazuola steeti iri.
Steeti ndị ahụ gụnyere Enugu, Anambra, Delta, Rivers, Lagos, Akwa Ibom, Bayelsa, Cross River na Imo.
A hụtaburu ọrịa monkey pox na Nigeria n’ọnwa Septemba 2017 wee ruo Septemba 16, 2018 mgbe ọ lara.
Nke a bụ ka ọ gachara afọ iri atọ na iteghete a hụdebere ya na Nigeria.
Ka ọ dị ugbu a,n’afọ a ihe dịka mmadụ iri iteghete na atọ (93) ebutela ọrịa ahụ na steeti iri ndị ọ metụtara.
Goomenti steeti Akwa Ibom, otu n’ebe ọrịa ahụ na-akpa ike ugbu a ekwuola na ya bụ ọrịa awụchaala ọzọ; ebe kọmịshọna na-ahụ maka ahụike bụ Dọkịnta Dominic Ukpong gwara ndị nta akụkọ sị na n’ala Nigeria site ka ọnwa Oktoba dị n’abali iri abụọ na anọ n’afọ a na a hụla ya bụ ọrịa n’ọtụtụ ndị mmadụ.
Ukpong dụrụ ọdụ ka a gbaara ọrịa ahụ ọsọ site n’izere inwe mmekọ ọ bụla n’ebe anụmanụ nọ n’ihi na ha nwere ike isi ụzọ ahụ nwete nje (virus) na-ebute ya, tinyekwara ka mmadụ zeere anụmanụ nwere ọrịa ma ọ bụ nke nwụrụ anwụ n’ebe ndị ahụ niile e nwere ọrịa Monkey Pox.
Ọ gakwara n’ihu gwa ndị mmadụ ka ha zeere ihe ọ bụla nke ụmụanụmanụ bu ọrịa metụrụ ahụ ma kewakwaa anụmanụ bụ ọrịa na ndị ebughị ọrịa.
Ụzọ ndị ọzọ a ga-eji gbaara ọrịa ọjọọ a ọsọ bụ site n’iji ncha kwọọ aka nke ọma mgbe ọ bụla imetụrụ anụmanụ bu ya aka; isi anụ ọ bụla nkeọma tupu eribe ya, tinyere ịkwụọ aka ugboro ugboro mgbe mmadụ letechara onye ọrịa.
Ọtụtụ ndị maara ihe ekwe na-akụ n’ala Nigeria gbaa gburugburu akpọọla oku ka goomenti kee ajị n’ume chụọ ọrịa a asọ ka ọ ghara ifesasị ebe niile site na ndị ọrụ ahụike ịmalite ọrụ ozugbo n’egbughị oge ọ bụla tupu mmiri ańaa garị, makana e mee ngwa ngwa e meghara ọdachi.
N’akụkụ nke ya, otu nwaanyị onye nke kwuru na ya na-enwe mmasị ịta anụ ndị ahụ bi n’ime ọhịa (bush meat) kwuru na ọ nweghị ihe ga-eme ka ya kwụsị ịta ha kama na ihe ya ga na-emezi bụ isi ha n’ọkụ nkeọma tupu ya erie anụ ahụ.