ỌKỤ ọgbụgba bụ ihe mberede jọrọ njọ nke ukwuu. Ọkụ adịghị emere ndụ ma ọ bụ akụnụba ebere. Ọkụ ọgbụgba baa n’ụlọ obibi, ụlọ ahịa ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ, ọ na-eweta ndaghachi azụ dị ukwu. Ọ na-emekwa ka mmadụ tụfuo ihe niile o nwere.
Ọkụ ọgbụgba nke dapụtara n’Onitsha na nso nso a na-egosikwa ụdị njikere ndị ala anyị dị n’ichekwa ndụ na akụnụba nke ala anyị. Onye ọbụla nke hụrụ otu ya bụ ọkụ siri malite ga -ama na anyị ka nwere ọtụtụ ihe anyị ga-eme ka anyị gbagota n’ogogo kwesịrị.
Ọ bụrụ na anyị erugo ogogo kwesịrị, ngwa ngwa ọkụ ahụ malitere, a ga- akwụsị ya, ọ gaghị eru ebe niile ahụ o ruru maka na o doro anya na ọkụ ahụ esighị n’elu daa. O nwere ndị e nyere ọrụ a na-akwụ ụgwọ kwa ọnwa mana mgbe ọbụla ọkụ ọgbụgba dapụtara, a kpọọ ha, ha a kọọ otu akụkọ ma ọ bụ nke ọzọ. Asighị m na ha amaghị ọrụ ha, kama ọ bụ na nwa mgbe eke amaghị akpụ isi ka ọ bụ na agụba adịghị nkọ?
N’ihi oke ihe anya mmiri na-adi adapụta, ndị na-azụ ahịa n’ala anyị niile nakwa ndị isi ahịa niile jikọọ aka ọnụ maka inwe ezi nchekwa. Ugbu a adịghị anụkwa na ndị ohi tikara ụlọ ahịa n’ime ahịa dịka ha si eme na mbụ. Ndị na-azụ ahịa n’ahịa niile jiri aka ha chee onwe ha nche gbasara ọkụ ọgbụgba.
N’ihi nke a, ha zụtara onwe ha ụgbọala e ji agbanyụ ọkụ, jiri aka ha zụọ ụmụ ikorobịa ahụ dị mma n’ọrụ mgbanyụ ọkụ. Ọzọkwa, ha gbapuo mmiri n’ahịa, nke a ga-eme na ihe mberede ọkụ ọgbụgba pụta, ha egbochie ya n’oge, agaghị enwe oke ntufu ndụ na akụnụba ma ọkụ ọgbụgba dapụta n’ ahịa.
Mana ọ bụrụ na ndị ahịa gaa n’ihu na-eche goomenti na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ, ha ga-aga n’ihu n’atufu afụfụ ha malitere n’ụtụtụ tụtụkọọ. Ndị na-azụ ahịa na ndị isi ahịa niile kwọọ aka pịa ụtara ede ka ihe wee ka mm. N’ezie, agaghị ekworo mgbagbụ ghara ọgụ. Ihe ka mma bụ ka ndị na-azụ ahịa chọọrọ onwe ha ọdị mma ugbu a.
Ọzọkwa na-iji beleta oke ihe mberede a, ndị ụlọ ọrụ na-ahụ maka njem okporoụzọ bụ FRSC kwesịrị ileba anya n’ụgbọala nnukwu na-ebu mmanụ e ji anya ụgbọala nakwa mmanụ ndị ọzọ ma ha adịkwa n’ọnọdụ kwesịrị ịga n’okporo ụzọ. Nke ọzọ bụ na ndị na-anya ụgbọala ahụ ma ha okwesiri ịnya ya.
I lebaa anya n’ọtụtụ ihe mberede na-adapụtakari n’ala anyị, ọ bụ nnukwu ụgbọala na-ebutakari ya. N’oge gara aga, ụgbọala na-ebu mmanụ e ji akwọ ụgbọala dara n’Amawbia, n’akụkụ ụlọ ọrụ na-agbanyụ ọkụ. O mebiri ọtụtụ ihe tinyerekwara ọtụtụ ndụ. Ọzọ bụ n’Umunya n’okporo ụzọ awara awara gara Onitsha, o mebiri ọtụtụ ndụ na ụgbọala.
N’ihi oke ihe anya mmiri nnukwu ụgbọala na-ekesa, o kwesiri ka ndị ala anyị na goomenti Nigeria lebaa anya ma chepụta ụzọ ka mma a ga-esi na-ekesa mmanụ e ji akwọ ụgbọala, mmanụ ọkụ (kerosene), mmiri mmụọ (gas) nakwa nnukwu ụgbọala e ji ebu ibu ka ha ghara idi na-ewetara ala anyị oke ntufu ndụ na akụnụba.