NDỊ Rotary Club Nnamdi Azikiwe University, Awka, District 9142 enyela ndị obodo Umuonaga dị n’ime Agulu-Awka onyinye ugegbe anya n’efu. Ha mere nke a site na nkwado ụlọọgwụ anya a kpọrọ Awka Eye Clinic. Ha mekwaziri ya iji kwalite ụzọ anọ ndị Rotary ji enyere ndị enweghị ka ọ ha ha aka.
Onyeisi Rotary Club ahụ bụ Rotarian Kanayochukwu Obidigbo kwuru okwu n’oge ha na-enye onyinye a n’ụlọ nzukọ obodo ahụ si na nke a bụ iji nyere ndị mmadụ aka n’efu ma bụrụkwa ụzọ ndị Rotary ji egosipụta onyinye amara.
N’okwu ya, ọ sịrị “Obi ga-abụ m sọ añụrị na onye ọbụla nọ ebe a nwetere ugegbe anya ya site na ntuziaka dọkịnta nyere, ebe ndị nwere oke nsogbu anya ga-eje n’ụlọ ahụike maka ịnyocha ha nkeọma.” Ndị otu Rotary nọkwazi oge ahụ bụ onyeisi na-eledo anya Zone 8, District 9142 Rotarian Dennis Ekemezie (PHF) na Rotarian Ken Eduzor.
Nsogbu anya ha nyochara gụnyere nke ndị bekee kpọrọ glaucoma, cataract na pterygium. Ọnụọgụ mmadụ iri asatọ na asatọ (88) bụ ndị nwetere elele ọma ahụ. Mmadụ iri na abụọ (12) bụ ndị nwere nsogbu cataract ebe mmadụ iteghete (9) nwere nsogbu glaucoma. N’oge ahụ, enwekwaziri ndị a gwara ha gaa n’ụlọ ahụike ahụ.
Dọkịnta na-ahụ maka anya (Optometrist Doctor) bụ Dọkịnta Johnbosco Ehirim gwara ndị mmadụ ka ha na-eleta ahụike ha anya nke ọma site n’ ịñụ mkpụrụ ọgwụ ha dịka e siri dee ya n’akwụkwọ. O kwuru;
“Oge ọbụla anyị anaghị enwe mmasị ịga ụlọ ahụike ma chefue na mgbọchi ọya ka ọgwụgwọ ya mma. Ka anyị matanụ na ọ ka mkpa igbochi ọrịa karịa ịgwọ ya. A na m arịọ onye ọbụla nọ ebe a ka ọ ñụchite mkpụrụọgwụ ya anya nke ọma ma tụkwazie nke ọtụtụ oge ọbụla n’ihi na anya gi bụ ihe iji ahụ ụzọ, lee ya anya mgbe ọbụla.”
Dọkịnta Ehirim nyere ndụmọdụ ka ndị nwere oke nsogbu anya gaa n’ụlọ ahụike ha dị na nụmba 302 Ziks Avenue, Awka ma nwetekwa pacenti iri ise (50%) a ga-ewepụ n’ụgwọ ha ga-akwụ. Ndị ọzọ sokwa rụọ ọrụ inyocha anya ahụ gụnyere Oriakụ Ngozi Umerie na Ngozi Analokwu bụ ndị ọrụ n’ụlọ ọgwụ ahụ.
Maazị Osita Chibogu bụ otu onye n’ime ndị nwetere onyinye ahụ gosipụtara obi añụrị ya si na nsogbu anya ya gụnyere anaghị ahụ mkpụrụ edemede pere mpe. O kwuru sị “Obi bụ m sọ añụrị na nke a na-atụ atụ. Ha nyochara anya m nke ọma tupu ha enye m ihe ndị a.”
Oriakụ Grace Ezenwa kwupụtakwara obi ụtọ ya ma kwuo na e nyochara anya ya n’efu ma nyekwa ya mkpụrụ ọgwụ. N’okwu ya, o kwuru sị; “Dọkịnta nyochara anya m nke ọma tupu enye m mkpụrụọgwụ. O kwukwaziri na enwere m nsogbu ‘cataract’ ma nye ntuzi aka ka m bia n’ụlọ ahụike maka ya.”