CHRISTIAN Association of Nigeria (CAN) akatọọla National Youth Service Corps (NYSC) maka ịchụ mmadụ abụọ ji otu afọ efe ala Nigeria bụ ndị nke nọ ọzụzụ (orientation course) nke afọ 2019 (Batch C Stream 1) na steeti Ebonyi maka ha jụrụ iyi ịba/tụrọụza (shorts and trousers).
Mmadụ abụọ ahụ jụrụ iyi ha n’ihi na dịka ha siri kwu na o megidere okwukwe ha, na kama ka ha yie peteri (skirt) bụ nke ha kwuru na ọ bụ akwa ụmụnwaanyị.
Onye okwupụta okwu NYSC na steeti ahụ, Ngozi Ukwuoma n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ kọwara na ọ bụ onyeisi (camp director0), Oriaku Isu Josephine na ndị otu ọrụ ya mgbe ha na-eme ngahari nnyocha jidere mmadụ abụọ ahụ ka ha yi akwa ọcha n’elụ (T-shirt) na peteri ọcha (skirt).
O nyere aha ndị ahụ ji otu afọ efe ala anyị dịka Okafor Love Obianuju na Odji Oritsetsolaye.
Ka a gbachara mbọ ịkọwara ha ka ha ghọta ma sọpụrụ iwu na-achị ogige ahụ na NYSC ma ha ekweghị, a kpọpụrụ ha ụlọikpe (camp court) ebe a nọrọ wee ma ha ikpe. Ka nke ahụ gachara, a chụpụrụ ha n’ogige ahụ.
Otu o sila dị, onye ndụmọdụ pụrụ iche nye onyeisi CAN n’ihe gbasara mgbasa ozi, Rev Adebayo Oladeji kwuru na e kwesịghị ịta ụmụnwaanyị abụọ ahụ ahụhụ makana ha kwụsiri ike n’okwukwe ha.
Oladeji chetara otu Nigerian Law School siri jụ ikpọlite Firdausa Al Janna Amasa n’oche ikpe (Bar) n’afọ 2017 makana ọ jụrụ iwepụ ịchafụ (hijab) ya, mana taa ụlọakwụkwọ ahụ na-anabatazi ọnọdụ ahụ.
O kwuru si na NYSC kwesịrị ịka wee nwee nghọta.
Rev Oladeji gara n’ihu kwuo na e kwesịrị isopụrụ ihe gbasara o kpukperechi ndị mmadụ.
O kwuru sị; “ọ bụ ya mere ọnwa olemole gara aga ka ụfọdụ ụmụnwaanyị ụka Alakuba (muslim) na-eme ngagharịiwe gbasara iyi ịchafụ (hijab) na Law School anyị ekweghị ekwu okwu megide ya makana ọ bụ oke ha, ekele dịrị Chukwu ha meriri. Anyị na-arịọ ndiisi NYSC ka ha gachighakwa azụ n’okwu ahụ. Ha ga-ahapụ ndị mmadụ ka ha gbasoo okwukwe ha.”
O kwukwara sị na ọ bụrụ na ngalaba goomenti dị iche iche enweghị nsọpụrụ n’ụzọ ndị mmadụ si ekpere chi ha ị mara na ha na-eso nzo ụkwụ ekwensu.
N’ikpeazụ, onye okwupụta okwu CAN ahụ dụrụ mmadụ abụọ ahụ ji otu afọ efe Nigeria bụ ndị a chụrụ achụ ka ha bupu okwu ahụ ụlọikpe, wee rụtụkwa aka otu ndị ụka Alakuba gbaa ụlọakwụkwọ Nigerian Law School akwụkwọ maka ihe banyere hijab.