ỤLỌ ọrụ ahụ na-ahụ màka njem siriri-wèrèrè n’okporo ụzọ n’ala Nigeria, bụ ụlọ ọrụ ‘Federal Road Safety Corps, (FRSC)’ ngalaba ya nke steeti Anambra agbapeela amụma njem awele nke ọnwa Mbà nke ahọ 2019.
Mmemme ịgbape atụmatụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ na mpaghara Upper Iweka dị n’Ọnịtsha, ma bụrụkwa nke isiokwu ya bụ “Road Safety Is a State Of Mind, Road Traffic Crash Is An Absence Of Mind, Stay Alert, Stay Alive” nke pụtara “Iji Awele Bụ Ịdị Úchuú, Ihe Mberede Okporo Ụzọ bụ Mkpafù Uchè; Mụrụ Anya, Dịkwa Ndụ.”
Ya bụ nnukwu mmemme dọtàra ndị òtù ọrụ nchekwa dị iche iche, tinyere aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote ya Dọkịta Nkem Okeke.
Na mbụ n’ozi nnọọ ya, onyeisi ụlọ ọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ Maazị Andrew Kumapayị kwuru na ọ bụ ihe doro anya na oge ọnwa mba na-abụkarị oge ọnụ ọgụgụ ihe mberede okporo ụzọ jì abawanya ụba, nakwa mgbe a gbakata a kwụrụ na-adịkarị n’okporo ụzọ dị iche iche, n’ihi mmemme na ọtụtụ njem na-ewere ọnọdụ oge ahụ; bụzị nke mere ụlọ ọrụ ahụ jiri gbapee ya bụ atụmatụ.
Na ntụnye nke ya n’ebe ahụ, onyeisi ụlọ ọrụ ahụ n’ala Nigeria, bụ Maazị Boboye FRSC kwuùru na ya bụ ụlọ ọrụ ga-anwụchikọ ma kpọchie mmọnwụ ọbụla ga-ewèta ihe mberede okporo ụzọ maọbụ a agbakata akwụrụ (n’ụdị ọbụla) n’ogè ekeresimeesi a.
Maazị Oyeyemi, nke ọ bụ osote onyeisi na-elekọta mpaghara nke ise, na Benin, bụ Maazị Keyinde Adeleye nọchitère anya ya, mèrè ka a mara na nnyocha e mègòrò na-egosi na mmọnwụ ewètela ọtụtụ ihe mberede n’okporo ụzọ dị iche iche n’ime ahọ ole na ole gara aga, ma kwuo na ụlọ ọrụ ahụ agaghị anabàtazị ụdị ihe ahụ ọzọ malitezie ugbua gaba, n’agbanyeghị na ha bụkwa ụlọ ọrụ na-asọpụrụ ma na-àkwàlite omenala na ọdịbendị.
O jikwàzịrị ohèrè ahụ dụọ ndị na-akwọ ụgbọala aka na ntị ka ha ghara ịgba ọnwụ-ọnwụ maọbụ wère anya mmanya wee na-akwọ ụgbọala, n’ihi na onye ọbụla e jidere na nke ahụ ga-eji anya ya wee hụ ntị ya n’ejighị ènyò.
A nọrọ na mmemme ahụ wee gbaa egwu ọdịnala dị iche iche, mee ihe ngosi, ma bụkwazie abụ.