IGBO sị na ọ na-abụ a kpaa akpaa, a rahụọ n’ute, ma sịkwa na ọ na-abụ a dị n’ìzù a nata ndị mmụọ ihe.
Ụlọ ọrụ ahụ okwu bànyere oke ala dị n’aka n’ala Nigeria, bụ ‘National Boundary Commission (NBC)’ agbapeela amụmà ọrụ ịkpa ókè àlà anya ọzọ na nsogbu oke ala ahụ na-adapụta n’etiti ụfọdụ obodo steeti Anambra na steeeti Enugu, n’ebe steeti abụọ ahụ gbàrà agbataobi, iji hụ na e kpèzìrì ya ma mekwa ka ufo tọrọ àtọ laghachi.
Mmemme ịgbape atụmatụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’Ajalị bụ isi obodo okpuru ọchịchị Orumba North, ma bụrụkwa nke dọtara ndị ji ọkwa ọchịchị, ndị nnọchi anya òtù ahụ, nakwa ụmụafọ obodo ndị ahụ ya bụ nsogbu oke ala na-adapụta n’etiti ha; ma ndị Anambra, ma ndị Enugu. Okpuru ọchịchị ndị ahụ ya bụ nsogbu oke ala metụtàra gụnyèrè ‘Awka North’ na ‘Orumba North’ nke steeti Anambra, na Eziagu na ‘Oji-river’ nke steeti Enugu.
N’okwu ya na mmemme ahụ, onye jigodi ọkwa dịka onyeisi ụlọ ọrụ NBC, bụ Maazị Adamu Adaji mere ka a mara mkpebi na ezi njikere ya bụ ụlọ ọrụ dị iwèta nsogbu ókè ala ahụ n’isi njedobe na n’ụzọ nwa mmụọ emegbula nwa mmadụ, ma nwa mmadụ emegbula nwa mmụọ, ọbụnadị dịka ọ kpọkùrù steeti abụọ ahụ ka ha jikọọ aka ọnụ iji mee ka nke ahụ mịta ezi mkpụrụ.
Ọ dụkwàzịrị ndị ịkpa oke ala ahụ dị n’aka ka ha were ọgụgụ isi na ọzụzụ e nyere ha wee rụọ ọrụ ahụ nke ọma na otu o kwèsiri, iji mee ka e wèta ọnọdụ udo ga-adị ọkpụtọrọkpụ n’etiti obodo ndị ahụ.
Na ntụnye nke ya, osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkem Okeke chetààrà ndị ahụ bịara ya bụ njem udo na steeeti Anambra na Enugu bụ nwanne, ma kọwaa mkpà ọ dị na ha bụ steeti na ndị nke ahụ metụtàrà jikọrọ aka ọnụ ma nabàta mkpebi na ọrụ ndị òtù ahụ n’obi ọcha, ọbụnadị dịka ọ dụkwàrà ha ka ha were eziokwu na ikpe nkwụmọtọ wee bàgide na ya bụ ọrụ, n’ihi na ihe nke ụwa bụ naanị nwa mgbe ntà ka ọ na-adị.
Osote aka na-achị steeti Enugu, bụ Oriakụ Cecelia Ezeilo kọrọ akụkọ ntọala bànyere otu steeti abụọ ahụ siri bụrụ ótù, wee ruo mgbe e kewàrà ha n’ahọ 1991 iji mee ka gọọmenti dị ụmụ mmadụ nso, ma rịọkwazie ndị ahụ ka ha ghara ikwe ka ọ bụrụ nsogbu ókè àla ga-etisà ha abụọ maọbụ mebie ịdịnotu ha dịbara kemgbe okike ụwa.
Na nzaghachi ha n’ótù n’ótù, onyeisioche nchere oge n’okpuru ọchịchị ‘Orumba North’ bụ Maazị Obinna Ikwueto, na ògbò ya nke Oji River, bụ Maazị Harrison Okeke, kèlèrè gọọmenti etiti maka nzọpụ ụkwụ ya n’iwèta nsogbu ahụ n’isi njedobe, ma kwekwazie nkwà na ha ga-ejikọ aka ọnụ, ime ka ya bụ nrọ bụrụ nke pụtara ìhè.
Ọ dị ncheta na ụlọ ọrụ NBC ekpeela ikpe bànyere nsogbu ókè àlà ahụ nke mbụ n’ahọ 1999, kpee ya nke abụọ n’ahọ 2015, kpee ya nke atọ n’ọnwa Septemba ahọ 2018, ma kpekwazie ya nke ikpeazụ n’ọnwa Juunu ahọ a, bụ ebe a nọrọ wee kpebie na-aga abàgide n’ọrụ mkpụrụ ụbọchị iri atọ, nke obodo ndị ya bụ ihe metụtara gà-esònye na ya, iji wee kpaa oke ala ahụ n’udo.