ÒTÙ jikọtara ụmụafọ steeti Anambra bi n’Abụja, bụ nke a kpọrọ “Anambra Town’s Peoples Association, Abụja (ASTPA)” emerùbela ụbọchị omenala Igbo nke ahọ 2019.
Oke mmemme ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’Abụja, bụ isi obodo ala Nigeria dọtara ndị sitere obodo dị iche iche na steeti Anambra bi n’Abụja nakwa mba ofesi, tinyere aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ.
N’okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Obianọ kewèrè nkwà na ọchịchị ya ga-aga n’ihu ịtụpụta na ịbàgide n’ọmarịcha atụmatụ dị iche iche ga-akwàlite ezi ọnọdụ obibi ndụ Ndị Anambra, nakwa agamnihu nke mmepe steeti ahụ n’izugbe.
Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote ya, bụ Dọkịta Nkem Okeke kpọkuru ụmụafọ steeti ahụ nọgasị n’ebe dị iche iche ka ha gaa n’ihu inye ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ nkwàdo iji kwụdosie ike n’ezi ọrụ dị iche iche o ji n’aka, bụ nke o kwùrù na mpụta ihe ya emetụtala ngalaba niile nke steeti ahụ.
Ka ọ na-echètara ha na ọ bụ akụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya, aka na-achị achị bụ Obianọ jikwara ohere ahụ wee dụọ ndị ahụ nà ndị Anambra bigasị n’ebe ndị ọzọ dị iche iche ka ha welataruo àkụ ha ụlọ, site n’iwunye akụnụba ha, ụlọ mmepụta ngwọ ahịa, ụlọ ọrụ, nakwa ihe mwunye ndị ọzọ dị iche iche n’ime steeti Anambra, iji kwalite ọnọdụ akpa ego nà mmepe steeti ahụ, ma kewàpụtakwara ụmụnne ha bụ ndị ntorobịa Anambra ohère ọrụ.
O mekwara ka ha mara na steeti ahụ bụzịkwa steeti kachara wee nwee ezi nchekwa na ezi ọnọdụ dị làrịị maka iwunye akụnụba n’ala Nigeria gbaa gburugburu, ọbụnadị dịka ọ tòkwàzịrị ha maka ịchịkọba ya bụ oke ihe mmemme, bụ nke o kwuru na ọ ga-enye aka ịkwàlitè omenala Igbo ma mekwa ka ụmụaka steeti Anambra bi n’ebe ahụ mara omenala ebe ha sì.
Na mbụ n’okwu ya, onyeisi òtù ASTPA, bụ Maazị Ezennia Iwenofu mere ka a mara mmemme ahụ bụ nke a màlitere n’ahọ 2003, ma bụrụkwa nke a na-eme kwà ahọ abụọ ọbụla, ọbụnadị dịka ọ kọwara ya dịka mmemme ha sì na ya were akwàlite ịma mma nke ọnatarachi, njirimara, na omenala Ndị Igbo.
A nọrọ na ya bụ mmemme, nke isiokwu ya n’ahọ a bụ “Igwè Bụ Ike” wee gbaa egwu ọdịnala ma mekwa ọtụtụ ihe ngosi dị iche iche e jiri mara ndị Igbo.