Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ n’okpuru ọchịchị Orumba South, dịka Ọhaneze Ndị Igbo gùzòbèrè ndị ndu ngalaba ya bụ òtù n’okpuru ọchịchị ‘Orumba South’ nke steeti Anambra.
Ya bụ nnukwu mmemme nguzobe bụ nke dọtara ọtụtụ ndị eze ọdịnala obodo dị iche na steeti ahụ, tinyere ndị ọrụ gọọmenti, ndị ndu obodo ọtụtụ ndị ọzọ okwu ha nà-ada ụda na ya bụ steeti.
N’okwu ya na mmemme ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’Ụmụnze, bụ isi obodo okpuru ọchịchị ahụ; onyeisioche òtù ahụ na steeti Anambea, bụ Maazị Damain Okeke-Ogene mere ka a mara na onye Igbo ọbụla, site n’ọmụmụ ya, bụ onye otù Ọhaneze Ndị Igbo, ma kpọkuzie Ndị Igbo ka ha na-akwàdo ma na-esonyesi ike n’atụmatụ, mmemme, na ihe dị iche iche òtù ahụ na-abàgide, n’ihi na ọ bụ ya bụ otu kachasị elu jikọtara Ndị Igbo ọnụ n’ụwa gbaa gbùrugburu.
O kwàrà arịrị maka ọtụtụ òtù dị iche iche na-esèlitesi isi ugbua n’aha Ndị Igbo, bụ nke ebumnobi ha dịgasị iche iche, ma kwuo na nke ahụ so n’ótù ihe na-echere Ndị Igbo aka mgba n’inweta ihe na-achọ na ihe ruuru ha n’ala Nigeria.
Ọ gazịrị n’ihu kpọkuo òtù ndọrọ-ndọrọ ọchịchị dị iche iche na steeti ahụ ka ha rube isi nyegara otu ahụ e si ebugharị ọkwa Gọvanọ n’ọgbọ nta nkwàdo atọ e nwere na steeti ahụ, n’ihi úrù dị iche iche nke ahụ ga-ewèta, ọ kachasị n’ịkwàlite ezi ọchịchị na usoro ime nwata ka e mèrè ibe ya.
N’okwu nke ya oge ọ na-anabàta ndị ahụ n’isi ụlọ ọrụ ya, onyeisi oche nchere ogè okpuru ọchịchị ‘Orumba South’ bụ Ọkaiwu Raymond Onyegu kpokùrù Ndị Igbo ka ha ghọta na òtù ahụ bụ isi otu jikọrọ ha niile ọnụ, ọbụnadị dịka ọ kpọkùrù ndị nne na nna ka ha na-akụnye njirimara, omenala na mkpụrụ ọma ndị
Igbo n’ime ụmụaka ha, malite n’ogè ha dị na nwata.
Na nzaghachi na n’ozi ekele ya n’aha ndị òtù ahụ e guzòbèrè ọhụụ na ya bụ okpuru ọchịchị, onyeisioche ya, bụ Maazị Gilbert Olumba kwèrè nkwà iji obi ga niile, ogè ha na ọgụgụ isi ha wee jeere ụmụafọ Igbo na ala Nigeria ozi dịka o siri kwesi, ọbụnadị dịka o mekwara ka a mara na ya bụ òrù chọrọ ụgbọala, isi ụlọ ọrụ, nakwa ego, iji wee bàgide ma rụọ ọrụ nke ọma.