ỤMỤAKWỤKWỌ Demonstration Secondary School, Eziagu nke nọ n’okpuru Federal College of Education, (Technical) Umunze dị n’Orumba South wụchara n’ogige Anambra Newspaper and Printing Corporation (ANPC) bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra maka njem nleta (excursion).
Ụmụakwụkọ ahụ bụ ndị karịrị iri anọ n’ọnụọgụ ma bụrụkwa ndị nọ n’otu mgbasaozi na mgbagha (Press and Debating Societies) bịara njem ahụ na Tọọzdee, ọnwa Novemba dị n’abalị asaa.
Onyeisi (MD) nke ANPC bụ Sir Chuka Nnabuife na ndị ọrụ ya nabatara ha nke ọma ma gwa ha na otu ha nọ na ya bụ ezigbo otu nke ga-eme ka ha mara ihe ekwe na-akụ.
Nnabuife kọwaara ha maka ANPC na otu ọrụ ha siri dị. Ọ gwara ha na ya so n’otu ha mgbe ọ nọ n’ụlọakwụkwọ, na nke ahụ nyeere ya aka nke ukwu.
Nnabuife kpọgharịrị ha na ngalaba dị iche iche e nwere n’ụlọọrụ ahụ ma kọwakwaara ha otu ọrụ ha siri dị. Ngalaba ndị ahụ gụnyere: ụlọakụkọ, ọba akwụkwọ, nchekwa, nkesa akwụkwọ akụkọ, ihe gbasara edo w.d.g.
Ọ gwara ha sị; “Ngalaba ndị a niile na-arụkọta ọrụ ọnụ ka ihe wee na-aga nke ọma, makana Igbo kwuru sị na a nyụkọọ mamịrị ọnụ, ọ gbọọ ụfụfụ.”
Ọ kọwaara ha na ọrụ onye ọbụla n’ebe ahụ na-adị dịka o kwesịrị ịdị. o kwuru sị; “Onye nta akụkọ (reporter) na-adị njikere mgbe niile ma jidekwa ngwa ọrụ ya, tinyekwara ịma ihe niile na-eme n’okirikiri ebe ọ nọ. Ọ na-aga ma na-eweta akụkọ mgbe niile, ọ naghịkwa emechi ọrụ mgbe ndị ọzọ ji emechi.” Otu a ka o si kọwaara ha ụzọ dị iche iche e si arụ ọrụ n’ụlọọrụ ahụ.
O nyere ha akwụkwọ akụkọ ndị ha na-epipụta bụ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra maka ụlọakwụkwọ ha, ma dụọ ha ọdụ ka ha gbasoo ụzọ mgbasaozi n’agbanyeghị ihe ha ga-abụ na ndụ.
Ndị nkuzi ma bụrụ ndịisi otu ụmụakwụkwọ ahụ, Christian Aniekwu na Chinyere Nwankwo n’aha onyeisi ụlọakwụkwọ, ndị nlekọta na ndị otu ụmụakwụkwọ ahụ kelere ndị ANPC maka nnabata nke ha nabatara ha. Ha kwuru sị na ha nwere nnukwu ọńụ maka njem ahụ ma too ha maka obi ndidi na umeala ha nwere.
Banyere njem nleta ahụ ha kwuru na ụmụakwụkwọ ahụ agaghị echezọ ya echezọ na ndụ ha.
Ha gara n’ihu too ndị nlekọta ụlọakwụkwọ ha maka inye ha ohere maka njem ahụ ma gọọrọ ANPC ọfọ ka ha si n’ike na-aba n’ike.
N’akụkụ nke ha, ụmụakwụkwọ ahụ nwere ańụrị maka njem ahụ. Chidiogo Aforka onye nke nọ n’ogo Seniọ Sekọndịrị nke mbụ (SS1) kwuru sị; “Obi bụ m ańụrị maka njem nleta nke a. Amụtara m ọtụtụ ihe; nke mere m ji ekele ndịisi ụlọakwụkwọ anyị maka inye anyị ohere ọma dị otu a, ma na-ekelekwa ndị ANPC. Ana m adụzi ụlọakwụkọ ndị ọzọ ndụmọdụ ka ha mee dịka anyị mere.”
David Ezebube onye nọkwa na SS1 kwuru sị; “Ana m enwe ańụrị makana taa ka anyị ji anya anyị hụ ihe ndị ahụ niile a na-akuziri anyị. Anyị mụtara ọtụtụ ihe. Ana m ekele ANPC na ndịisi ụlọakwụkwọ anyị.”
N’aha ANPC ka Oriakụ Rose Oranye bụ Editọ ji wee kelee ụmụakwụkwọ ahụ na ndị nkuzi ha maka njem ahụ. Ọ gwara ha sị; “Daalunu maka njem a nke ụnụ bịara n’ụlọọrụ anyị. Nke a gbara anyị ume nke ukwu. Anyị nwekwara olile anya na e mechaa ọtụtụ n’ime ụnụ ga-enwe mmasị ịrụ ọrụ mmgbasa ozi ( journalist)”
Oranye gwakwara ha ka ha na-ede ihe ma na-eweta ya n’ụlọọrụ ahụ ka a na-etinyere ha n’akwụkwọ akụkọ.