September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Na South Africa, a tụọla onye uweojii nga maka igbu nwa Nigeria

A TỤỌLA onye uweojii South Africa nga afọ iri atọ maka igbu onye Nigeria.

Onye uweojii ahụ aha ya bụ Austin Luciano Reynold gbagburu Ebuka Okoli onye steeti Anambra bi na mba South Africa n’afọ gara aga bụ 2018.

Ọ bụ na Mọnde izuụka a ka a tụrụ Reynold nga ka a machara ya ikpe nke gụnyere igbu ọchụ na izu ohi.

Reynold bụ onye gbara afọ iri abụọ na anọ ka e kwuuru na o gburu Okoli na Durban nke dị na Kwa Zulu-Natal, South Africa. Ọ gbagburu ya ka e nwere ọgbaghara ekwesịghị ekwesị (unauthorised raid) n’obodo ebe Okoli bi.

Onye ya na Reynold soro kpaa arụ ahụ bụ Brinley Palio gbara ama otu Reynold si kpa ya bụ arụ n’ihu ọka ikpe Shyam Gyanda.

N’akụkụ nke ya, Abike-Dabir-Arewa bụ onyeisioche otu na-ahụ maka ndị Nigeria bi na mba ọzọ (Nigerians in Diaspora Commission) gosịrị afọ ojuju maka ikpemkwụmọtọ ahụ. O kwuru sị; “Obi bụ anyị ańụrị na eziokwu apụtala ihe dịka e ekpere ikpe kwụ ọtọ.”

Dabir gakwara n’ihu gwa ndị Nigeria bi South Africa ka ha nụrụ ndụmọdụ onyeisiala Muhammadu Buhari nke bụ ka ha na-eme nke ọma ebe ọ bụla ha nọ.

%d bloggers like this: