.. Mụọ aka ọrụ
ỤMỤ akwụkwọ ụmụ nwaanyị a chụpụrụ n’ụlọ akwụkwọ na Tanzania maka ịtụrụ ime mkpuke abụrụla ndị gụchara akwụkwọ ha.
Ka nke a sịrị mee bụ na otu onye aha ya bụ Martina Simon bụ onye nkuzi lagoro ezumike, ma bụrụ onye gbara afọ iri asaa na asaa hibere ụlọakwukwọ nakwa ebe a na-elekọta ụmụ ha mụrụ ka ha nwee ike ịgụ akwụkwọ ha ma ọ bụ mụọ ihe ọbụla ha chọrọ n’enweghị nsogbu. Onye nkuzi a mere ka ụmụagbọghọ ndị a bụrụ ndị ga-ama aka nri na aka ekpe ha.
Ọ dị mma ka ndị mpahara mba ụwa ndị ọzọ mụta ihe n’ọmume ọma onye nkuzi a mere makana dịka ha gụchara kwụkwọ ugbu a ọ ga-enyere ha aka ịga n’ihu ibụ ezi ihe ọbụla ha chọrọ ibu.
N’ezie, ị gaa n’ime ime obodo ị ga ahụ ụmụaka kwesịrị ịnọ n’ụlọakwụkwọ ma n’ihi afọ ime, ha bụzi ndị e dunyere ọgbọ nna ha nakwa ndị tọrọ nna ha ka ha lụba ha dịka nwunye.
Otu n’ime ụmụaka ahụ tụrụ ime mgbe ọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Debra Emmanuel, nwatakịrị ahụ bụkwa onye ndị mụrụ ya chụpụrụ n’ụlọ ma bụrụkwa onye a chụpụrụ n’ụlọakwụkwọ sokwa na ndị gụchara akwụkwọ ma mụọ ka e si akwa akwa.
Ọ sịrị na ya ga-esite n’ọrụ ịkwa akwa ya mụrụ bido ọrụ nke ya, na ya ga-esitekwa n’ego ya ga na-enweta wee zụọ ụmụejima ya mụrụ mgbe ya dị afọ iri na asaa n’ụlọakwụkwọ.
Ọ ga-abụ ihe dị mma nke ukwuu ma ọ bụrụ na ndị kpatara ego n’obodo na ndị ọchịchị n’ala ọbụla ńomie Martina Simon.
Nke a ga-enye aka beleta ịtụ ime mgberede ụmụaka, nakwa ụmụagbọghọ ite ime jupụtara ebe niile ugbu a.