September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Otu Nigerian Library Association Anambra emeela emume ome n’afọ ha

NDỊ otu Nigerian Library Association, Anambra State Chapter emeela emume ome n’afọ ha, nke a kporo 2019 Conference/Annual general meeting.

Abalị atọ ka ha mere emume a nke ha malitere na Tuzdee abalị atọ nke ọnwa Decemba. Ọ bụ n’ọba akwụkwọ Anambra, Prof. Kenneth Dike Central E-Library, Awka ka ha mere ya.

Ọtụtụ ndị mmadụ ọnụ ruru n’okwu bịara ụbọchị ahụ a malitere ya nke gụnyere kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkuzịrị ọha na eze ihe ha kwesịrị ịma (Commissioner for Information and Public Enlightenment), C. Don Adinuba.

Mgbe ọ na-emepe emume ahụ kọmịshọna Adinuba kwuru na ikuku ihe ọma nke na-eku na steeti Anambra ekurutela n’ọba akwụkwọ ahụ.

O kwuru nke a n’ihi nturu ugo dị iche iche nke ndị steeti Anambra na-enweta n’ala Nigeria nke ọba akwụkwọ ahụ so wee nweta, ebe ha bụ ọba akwụkwọ kacha mma na Nigeria.

Adinuba toro Udeze maka mbọ ya niile ma gbaa ama na goomenti steeti Anambra nke Gọvanọ Willie Obiano nọ n’isi ya na-agba mbọ dị egwu maka idozi ọba akwụkwọ Onitsha, tinyekwara ọba akwụkwọ ndị ọzọ.

N’okwu mmalite ya, onyeisioche mmemme ahụ bụ Hon Chris Okaka gọrọ ọfọ ọma maka emume ahụ ma too onyeisi ha bụ Dọkịnta Nkechi Udeze. Ọ kpọkukwara Chineke ka ọ gozie ndị otu ahụ.

N’okwu nke ya, onyeisi (Director) Anambra State Library Service ma bụrụkwa Acting Chairman Nigerian Library Association, Anambra State Chapter, Dọkịnta Nkechi Udeze kwuru sị, “Taa ka anyị na-amalite emume ome n’afọ anyị na-eme n’otu a. Nke afọ a bụ ọpụrụ iche, isiokwu ya bụ: ‘Library For the National Digital Agenda.’

Anyị nọzị n’ụwa ọgbara ọhụrụ (digital). Isiokwu a bụ nke obodo ọ bụla na-ekwu maka ya. Ya mere, emume a ga-eme ka ndị otu anyị (librarians) ghọta ihe a na-ekwu na usoro dị na ya. Udeze gara n’ihu too gommenti Anambra site n’aka Kọmishọna C. Don Adinuba.

Prof. E.E Adomi n’okwu nke ya (keynote address) kwuru sị na usoro ọgbara ọhụrụ (digital) dị mma mana a ga-aghọtakwa na ihe e dere ede n’akwụkwọ dịkwa mkpa.

N’akụkụ nke ya, Amaka Josiah-Okoli toro onyeisioche otu ahụ bụ Dọkịnta Udeze maka mbọ ya. Ọ kọwara sị na ọ na-aghọ nkọ ma mara anya e lere ele na nke a rọrọ arọ.

N’okwu ha dị iche iche, onyeisi ngalaba ihe ọmụmụ Library/Information n’ụlọakwụkwọ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ Dọkịnta Norbert Amechi Agbanu, Nwamefor Rapheal na Rev Prof. C.O Nwosu toro ndị otu ahụ maka mbọ ha.

Ihe ndị pụtara ihe e mere gụnyere; egwu nke ndị ụmụakwụkwọ COOU gụrụ ma gbaa, ejiji omenala Igbo na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

 

%d bloggers like this: