
OTU ndị ajadu a kpọrọ Virtuous Widows Association mpaghara South South na South East emeela ọgbakọ nkuzi maka ndị ajadu.
Ha mere nke a iji kụziri ha ọrụ aka dị iche iche dịka; isi nri, ịkwa akwa, ịsụ ịchafụ, ime ncha w.d.g.
Ọ bụ n’ụlọ ezumezu nke Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkụ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra ka ha nọrọ wee me ya.
Ọgbakọ a kpọkọtara ọtụtụ ndị obodo jiri biri ndị gụnyere HRM Igwe Benneth Izuchukwu nke Umuleri, onye hibere otu ahụ (founder) Oriakụ Ifeyinwa Egbosiba, onyeisi (MD/CEO) Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) Sir Chuka Nnabuife, Editọ bụ Oriakụ Rose Oranye, ndị nchịkọba (coordinators) otu ahụ Oriakụ Caroline Anoka, Oriakụ Hope Ekesiuba, Oriakụ Juan Ubaka na ndị ọzọ.
Nwunye aka na-achị steeti Anambra bụ Dọkịnta Ebelechukwu Obiano na kọmịshọna na-ahụ maka ọdị mma ụmụnwaanyị Lady Ndidi Mezue bụ ndị nke onye sị na ngalaba na-ahụ maka ụmụnwaanyị (director state Ministry of Women Affairs) Oriakụ Hope Ekesiobi nọchitere kwuru sị na otu ahụ bụ otu nnọọrọ onwe nke na-ahụ maka ndị ajadu na ọdị mma ha.
Ha kwuru sị; “Anyị kwadoro ọgbakọ ụnụ nke bụ ịmụta ihe ma kwadokwa onye hibere otu a.”
Egbosiba gara n’ihu dụọ ha ọdụ ka ha chọọ ihu Chineke ka o wee dịrị ha na mma.
HRM Igwe Benneth Izuchukwu toro onyeisi ndị ajadu ahụ bụ Egbosiba, tinyere ndị ajadu niile maka mbọ ha. O toro onyeisi ahụ wee kwuo na o keela ọtụtụ ndị ajadu akwa site na nkwado nke ya bụ onye eze.
Igwe Izuchukwu gwara ha ka ha were Jesus Christ dịka di ha ma dụkwaa ha ọdụ ka ha tinye uche ha n’ihe ọmụmụ nkuzi nke a na-enye ha.
Ọ gakwara n’ihu kelee onyeisi ANPC Sir Nnabuife maka inye ndị ajadu ohere ime ọgbakọ nkuzi ahụ n’ụlọọrụ ahụ n’efu, ma kelekwaa goomenti steeti Anambra nke Chief Willie Obiano nọ n’isi ya, na nwunye ya bụ Dọkịnta Oriakụ Ebelechukwu Obiano maka mbọ ha n’ebe ndị ụwa na-atụ n’ọnụ nọ.
Onyeisi ANPC, Sir Chuka Nnabuife kwuru na ọ bụ ihe dị mma dịka ndị otu ajadu ahụ nọ na ANPC wee na-emerube ọgbakọ nkzui ahụ iji kwado ndị ajadu n’ọrụ aka dị iche iche nke ga-enyere ha aka.
Nnabuife dọrọ ha aka na ntị ka ha tinye uche ha na nkuzi a na-enye ha nke ga-enyere ha aka na ndụ.
Ọ kọwara ọnọdụ ajadu dịka nke nwaanyị di ya nwụrụ na-anọ, ya na ụmụ ya na ndụ ya niile.
N’okwu ya na mmemme ahụ, onye hibere otu ahụ, Oriakụ Ifeyinwa Egbosiba kwuru sị na a ga-akwado ndị ajadu ọnụọgụ ha dị otu narị n’ọrụ aka dị iche iche iji nyere ha aka ịzụ ụmụ ha ma tụnyekwa ụtụ ha n’obodo.
Ọ kpọkuru ndị ajadu ka ha kee ajị n’ume wee zụọ ụmụ ha. O kwuru sị; “Mee ka anyị mata mkpa gị na ezinaụlọ gị kama ịga na-achọ onye enyemaka ga-apụta otu ụbọchị kparịa gị. Anyị kwesịrị inyere onwe anyị aka. Leruonụ ụmụ ụnụ anya, ọ bụrụ na ịgaghị emenwu ya mee ka anyị mara ihe kpatara ya.”
Otu onye na ndị nchịkọba ha bụ Oriakụ Caroline Anoka dụrụ ha ọdụ ka ha na-akwanye onwe ha ugwu mgbe niile.