
OKE ọńụ dara n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra dịka ha nọ na Tuzdee mee emume abụ ọńụ nke Ekeresimesi (Christmas Carol).
Emume ahụ kpọtụrụ akpọtụ, ụmụaka tinyere ụmụakwụkwọ si n’ụlọakwụkwọ dị iche iche na ndị okenye si n’elu na ala daa ka igurube n’ụlọ ezumezu ANPC.
A bụrụ abụ ma guo ihe ọgụgụ iteghete sị n’akwụkwọ nsọ, ụmụakwụkwọ mere ihe ngosi dị iche iche ebe ndị otu National Light Art House mere ejiri mara ha iji mee ndị mmadụ obi ụtọ.
Emekwara asọmpi edemede, tinyekwara itụ okwe ‘scrabble’ w.d.g.
N’okwu mmalite ya, onyeisi (MD/CEO) nke ụlọọrụ ahụ bụ ‘Sir’ Chuka Nnabuife sị na ukwe karol Ekeremesi bụ ihe a dị mbụ eme mana ndị ANPC na-akpachapụ anya ihụ na nke ha bụ ọpụrụiche.
O kwuru sị; “N’afọ a, anyị chọrọ ime ihe pụrụ iche maka ụmụaka na ndị ntorobịa. Ya mere anyị gbalịrị ịkpọta ọtụtụ ụlọakwụkwọ dị n’Awka”.
Nnabuife kọwara sị na n’ihe ngosi dị iche iche otu National Light Art House na-egosi na a tụrụ anya na a ga-ahụtakwa ya n’ebe ụmụakwụkwọ dị iche iche dị iji kwalite ihe emereme na asụsụ.
O kwukwara sị na ha tinyekwara asọmpi edemede bụ nke ụlọakwụkwọ tuuru ugo na ya ga-erite onyinye ‘trophy’.
O kwere nkwa na nke afọ dị n’ihu ga-aka mma ebe a ga-ewebata asọmpi n’asụsụ Igbo n’ihi na ọ bụ sọosọ ANPC nwere akwụkwọ agụmagụ Igbo nke bụ ọkpọkọpị n’ụwa niile (Ka Ọ Dị Taa).
N’akụkụ nke ya, onyeisioche mmemme ahụ bụ Ọkammụta Anthony Eze kwuru sị; “Anyị nọ ebe a maka ụmụ anyị, ndị ndu nke ọdịnihu, ka ha wee nwee ańụrị na ngozi.
Ndịnkuzi gbaanu mbọ na-akụzi ihe nke ọma.Maranụ Chukwu ma na-ekpe ekpere.Anyị na-aga ụka iji wee na-agbaziri ụmụaka.”
Eze gakwara n’ihu nye ndụmọdụ ka mmadụ buwe Chukwu ụzọ n’ihe niile ma kpekwaa ka Chineke gọzie ma nye onye ọbụla amamihe ma mee ka ụmụaka gaa n’ihu wee buru nnukwu mmadụ n’ọdịnihu.
Onye ọbịa pụrụ iche na mmemme ahụ bụ onyeisi Anambra Broadcasting Service (ABS) Nze Uche Nworah toro ndị nlekọta ANPC maka ịchịkọba mmemme ahụ.
Nworah gosịrị afọ ojuju o nwere ma tokwaa ọchịchị Gọvanọ Willie Obiano bụ nke mere na a na-emezi emume na steeti Anambra n’atụghị egwu ọbụla n’ihi ezi nchekwa.
Ọ gara n’ihu kelee Sir Chuka Nnabuife na ndị ọrụ ya ma kpọkukwaa ndị steeti Anambra bi obodo oyibo ka ha na-alọtaru ụlọ iji sonyere ihe ọma na-emenụ.
Oriakụ Flora Ilonzo (Anyafulugo), bụ onye wetara ihe onyinye nrita iko ‘trophy’ nwere ọńụ maka emume ahụ. O toro ụlọọrụ ANPC tinyere ụmụaka na ụlọakwụkwọ ndị bịaranụ, ma nyekwa ha ezi nkwado.
Ihe pụrụ iche e mere na mmemme ahụ gụnyere Fada Ekeresimesi nke si ala bekee wụchaa n’ogige ANPC. Nke a nyere ụmụaka oke ọńụ ebe o mechara nye ha onyinye n’otu n’otu.
