NDỊ Igbo bụ agbụrụ na-azụ ahịa mana ọ na-adị egwu ma a banye n’ọnwa Ekeresimesi bụ Disemba.
Ka ọ dị ugbu a, ọnwa agbaala ọkara ma gafee nke bụ na izuụka ọzọ ka a ga-agba Ekeresimesi.
Ndị kwuru okwu sị na agha a kara aka anaghị eri nwa ngwọrọ; ya mere ọ sarala ọkụ. Ahịa niile na-ekwozi ka orimiri nke bụ na ọ bụrụ na ịmaghị ihe imere, ume ekoropu gị n’ọma ahịa. Ụfọdụ zụrụ ahịa na-egbego egbego, ụfọdụ azụrụ na-agbada agbada.
Dịka anyị maara, ka mmadụ na-azụ ahịa ka mmụọ na-azụkwa. Ebe ụfọdụ bịara ịzụrụ ihe na-akpa ha ka ụfọdụ bịakwara izuru ihe na-akpa ha n’ohi.
Ha na-eme nke a site n’iburu ngwa ahịa ma ọ bụ ibu (load) mmadụ gbalaga. Ụfọdụ ka a na-akpọ ndị ‘aka n’akpa’. Ndị a bụ ndị na-ewere ego mmadụ tinyere n’ime akpa ya larie.
Iji gbanarị ọdachị ndị ohi, ụfọdụ ndị mmadụ na-anyanye akpa ha n’ọlụ, ebe ụfọdụ na-etinye ego n’ime ọbante ha. Ọ dị egwu, mana n’ime ihe niile ahịa na-azụ gwoo gwoo.
N’akụkụ ndị na-ere ahịa, ụfọdụ na-akọwa na ahịa ha na-aga aga ebe ụfọdụ na-ebe akwa na njọ ahịa na-egbu ha.
Otu nwoke na-ere ihe ụmụnwaanyị na-akwanye n’isi kwuru na ha enweghị nsogbu, na ahịa ha na-aga werewere, nke pụtara na ha na-agba aka ahịa.
Ụmụnwaanyị juru na-azụrụ ụdị ha chọrọ maka ya bụ oke emume Ekeresimesi.
Nwata nwaanyị aha ya bụ Ebere onye na-enyere nne ya aka ere ahịa ihe e ji esi ofe osikapa (stew); dịka tomato mkpọ, mmanụ ọpapa, magị na ngwo ngwo dị iche iche kwuru sị na ahịa na-aga nke ọma, ma kọwaa na a banye izuụka ọzọ na ọnụ ego ahịa ndị ahụ ga-arị elu. Ya mere ọtụtụ ndị maara ihe na-aganụ ji ugbu a na-ego ihe ndị ahụ tupu ekete ekwopu ike.
Na ngalaba ndị na-ere akwa dị iche iche ebelebe na-egbu. Ndị mmadụ na-ego akwa n’ike n’ike.
Otu nwaanyị kwuru na ya na-egoro ụmụ ya ndị nwaanyị akwa mkpụcha (gown) n’ihi na ya gote nke a na-eyi n’elu iche, gote nke a na-eyi n’ala iche na ọ ga-eri nnukwu ego.
N’ahịa Eke Awka efe enyeghị n’ebe ndị na-ere ọkịrịka mgbede nọ, ndị a na-akpọ ụwa mgbede. Ndị mmadụ juru eju na-ekwo ekwo mana onye nta akụkọ anyị chọpụtara na ndị ọrụ goomenti na-ahazi ihe na-achụsasi ha n’ihi na ha na-anọchị ụzọ.
Otu nwoke ya na nwunye ya na-azụ ahịa provishọn kwuru sị; “Anyị enweghị nsogbu, ma a na-agba Ekeresimesi ma anaghị agba mmadụ ga na-ańụ ihe ọńụńụ. Onye egoghị maka onwe ya o goro maka ụmụ ya.”