NDỊ otu na-arụ ọrụ ịhụnanya n’ụka ejikọtala aka ọnụ gbaara ndị ọrụsị na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ Ekeresimesi. Ndị ahụ bụ ndị otu Madonna Mercy Family, St Vincent de Paul na ndị J.D.P.C. nke ụlọụka St Thomas Aquinas Parish G.R.A Awka.
Emume ịhụnanya ahụ kpọtụrụ n’ụlọụka ahụ n’ehihie ụbọchị ụka gara aga, ọnwa Disemba a dị n’abalị iri na ise.
Ndị ọrụsị ndị nke gụnyere ndị ọrịa,ndị kpuru isi na ndị ngwọrọ, tinyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ dịka ndị ogbenye na ndị arịrịọ si steeti dị iche iche wee bịa. Otu onye kpuru isi si Oji River nke dị na steeti Enugu wee buru mgbongwo o ji eti egwu wee bịa n’akụ ngwa. N’ezie ha nwere ańụrị, gbaa egwu ma tokwaa Chineke n’ebe ọ dị ukwuu.
E nyere ha ihe onyinye dị iche iche nke gụnyere ihe oriri, akwa w.d.g bụ ndị nke ha buru wee laa n’ụlọ ha. Ha rịkwara ma ńụọ n’otu aka ahụ.
Rev Sr Gaudentia Nwankwo kọwara na ọ bụ otu ndị ọrụ ịhụnanya chịkọbara emume ahụ bụ nke a na-eme afọ ọ bụla n’oge Ekeresimesi.
O kwuru sị; “Ndị otu a na-ahụ na e legharaghị ndị onweghị ka ọ ha ha anya. Ọnọdụ ọ bụla mmadụ nọ n’ụwa bụ uche nke Chineke n’ebe onye ahụ nọ, ọ bụ ka ha hapụ iche na ndị mmadụ echezọọla ha, ka e mee ha obi ańụrị.”
N’akụkụ nke ya, otu onye n’ime ndị otu ọrụ ịhụnanya ahụ bụ Oriakụ Vivian Eze kwuru sị; “Emume a bụ ome n’afọ. Anyị na-akpọkụlọta ndị ọrụsị nọ n’okirikiri Awka. Anyị na-ekele ụkọchukwu parish Aquinas bụ Fr Anthony Akabuogu maka ezi nkwado nke ọ na-enye anyị. Ana m akpọkuzi ndị mmadụ ka ha kwado anyị n’ọrụ a n’ihi na Onyeweayị kwuru sị na ịhụnanya bụ igodo nke alaeze eluigwe ma na-ekpochapụkwa ọtụtụ mmehie.”
Victoria Onyenze na Ajegbu Kate sokwa n’otu ịhụnanya ahụ kwuru sị na ha na-eji oge oriri a wee na-echeta ndị e nweghị ka ọ ha ha, mee ha ańụrị.
Chike Okoli kwuru sị; “Ọ dị mkpa ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ na anyị ga-enyere ndị ogbenye aka; ọ bụ otu n’ime ihe Jesu mere mgbe ọ nọ n’ụwa. E nwere ọtụtụ ụzọ e si enyere ndị enweghị ka ọ ha ha aka dịka inye ha ụlọ, nni, ọrụ, agụmakwụkwọ, tinyekwara ilekọta ahụike ha.
Sir C.S Chikezie bụ onyeisi odibo (male chief servant) dịka ha si akpọ ya kwuru sị; “Anyị na-eme emume a afọ ọ bụla iji mee ndị onweghị ka ọ ha ha obi ańụrị. Anyị na-agba mbọ iso nzọ ụkwụ Christ, inwe ezi mmekọrịta n’etiti ha n’enweghị ịkpa oke ọ bụla. Nke a bụ ohere iji gbaara ha Ekeresimesi.”
Ụkọchukwu parish ahụ bụ Fr Anthony Akabogu kelere mmadụ niile ma nonyekwa iji gbaa ndị ahụ onweghị ka ọ ha ha ume. O butere ihe onyinye dị egwu ma sorokwa ha ńụrịa, gbakwaa egwu.
O nyere ndụmọdụ wee kwuo sị; “Ka ịhụnanya a kpalite n’ime anyị okwukwe na ibi ndụ dị mma.”
N’akụkụ nke ha, ndị ahụ a gbaara Ekeresimesi bu ụkpa ekele wee bịa. Obi bụ ha sọ ọńụ n’ihi ihe ndị ahụ e meere ha.
Maazị na Oriakụ Akachukwu bụ ndị si Emene Enugu wee bịa kwuru sị; “Obiọma juru anyị afọ na o nwere ndị na-echeta anyị.”
N’akụkụ nke ya, Felicia Samuel si Mgbakwu kwuru sị na ya bụ ihe e mere dị ya mma.
N’ikpeazụ, ha bu ihe onyinye dị iche iche wee laa, ebe e jikwa ụgbọala wee bughachikwaa ndị e ji ụgbọala bute.