
EMUME mmechi afọ nke ndị ụlọakwụkwọ The Divine Wisdom Nursery and Primary School dara ụda ma bụrụ ihe ọńụ. Ụlọakwụkwọ a dị n’akụkụ obi goomenti steeti Anambra.
Ụmụakwụkwọ ha gosịrị ihe ha jiri bụrụ ọka ibe site n’igosipụta ihe ngosi dị iche iche n’ihu ọha na eze.
N’okwu ya na mmemme ahụ, onyeisioche Chief Charles Nnabude Ofokansi toro ụlọakwụkwọ ahụ nke o kwuru na ọ tụrụ ya n’anya. Ọ gọọrọ ụmụaka ahụ ọfọ ihe ọma, bụ ndị nke ọ kọwara dịka ndị ndu nke ọ dị n’ihu.
O kelekwara ndịisi na ndị nkuzi ha maka ezi mbọ ha n’ụlọakwụkwọ ahụ.
Ya mere, o kwere nkwa ikwụrụ onye ga-abụ onye mbụ n’ịma akwụkwọ na n’ezi agwa ụgwọ akwụkwọ afọ ọzọ.
Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Winifred Obiesili ji ańụrị wee kọwaa na o nweghị oke ihe o nwere mgbe o bidoro ụlọakwụkwọ ahụ n’afọ 2005 mana taa ụlọakwụkwọ ahụ na-abawanye n’ike n’ike.
O kelere Chineke ma kwukwaa na ụmụakwụkwọ ka na-abịakwa n’ike n’ike na-edebanye aha. O kelekwara ndị nne na nna maka nkwado ha na mmemme ahụ.
Onye na-anọchite ogbo nta vootu Awka North n’ụlọ nzukọ omebe iwu steeti Anambra bụ Hon Ifechukwu Nwokoye bịara ma tokwaa ndị nlekọta ụlọakwụkwọ ahụ ma kwe nkwa ịkwụrụ ụfọdụ ụmụakwụkwọ ụgwọ akwụkwọ, tinyere ihe ndị ọzọ ọ ga-enye nkwado ya dịka asompi (quiz). N’ikpeazụ o nyere ha onyinye dị iche iche.
Ọtụtụ ndị mmadụ bịara ma nye ụmụakwụkwọ ahụ nkwado tinyere ihe onyinye dị iche iche dịka akwụkwọ, mkpịsịodee w.d.g.
Ndị bịara mmemme ahụ gụnyere: Emeke Oraekie, Nchekwube Dunga, Chukwuma Okolo, Ofonkasi bụ PG Oba Ofemili, Chukwuma Okolo w.d.g.