KA ọ dị taa, gọọmenti etiti agbapeela ma mepee orụ ngo mbize Ụmụnze a rụchàgòrò arụcha, ya na okporo ụzọ e dozigharịrị edozigharị n’obodo ahụ, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Orumba South na steeti Anambra.
Ya bụ ọrụ ngo, bụ nke a malitere n’ahọ 2018, rụchaa ya n’ọnwa Juunu ahọ gara aga, ma bụrụkwa nke gụnyere ịrụ okporo ụzọ ogologo ya ruru kilomita atọ na ụma atọ, tinyere ọwà mmiri a wàkwàrà n’akụkụ ya abụọ.
N’okwu ya na mmemme ịgbape ọrụ ngo ahụ, onyeisi ala bụ Muhammadụ Buharị, nke onye nọchitere anya ya bụ Minista na-ahụ maka gburugburu, bụ Oriakụ Sharon Ikeazọr, kọwàrà na nke ahụ sò n’ọtụtụ urù dị iche iche steeti ahụ ga-erita n’ọchịchị ya tupuu oge ịnọ n’ọkwa ya agwụ.
O kwuru na ọ ga-aga n’ihu ime nwata ka e mere ibe ya, dịka o siri metụta ikesà èrèrè ọchịchị onye kwuo uche na akụrụngwa e ji akwalite ọnọdụ obibi ndụ na mpaghara dị iche iche n’ala Nigeria.
Na ntụnye nke ya, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kèlèrè onyeisi ala Buharị maka ọrụ ọma ya na mgbata ọsọ ya dị iche iche na steeti ahụ, ọ kachasị dịka o siri metụta mbize, bụ nke o kwuru na o sò n’otu ihe kacha echéré steeti ahụ aka mgba;
ma gosipụtakwa olileanya o nwèrè na steeti ahụ ga-aga n’ihu irita èrèrè site n’aka gọọmenti etiti, n’ihi na a ka nwègàsịrị ihe ole na ole dị iche iche kwesiri ka e lebàára ha anya.
Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote ya, bụ Dọkịta Nkem Okeke kpọkùrù ma dọọ ụmụafọ steeti ahụ aka na ntị bànyere ikpofù atịtị aghara aghara,
na ịrụkwasa ụlọ maọbụ ihe ndị ọzọ n’elu ọwà mmiri na n’ebe na-ekwesighị ekwesi, n’ihi na ọ bụ ihe dị òtù ahụ na-akpata mbize.
Na mbụ n’okwu ya, onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ego ọrụ maka ihe metụtara gburugburu dị n’Abụja, bụ “Ecological Fund Office, Abuja” bụ Dọkịta Habiba Lawal, nke ọ bụ onye nhazi n’ụlọ ọrụ ahụ,
bụ Maazị Felix Okeke, nọchitere anya ya, dụrụ ndị obodo ahụ ka ha gbaa mbọ chekwaba ma leruo ihe ndị ahụ a rụrụ anya nke ọma, iji hụ na e lekọtara ha otu o kwesiri; ka ha wee nọtòókwa aka.