NDỊ ọrụ agha ala anyị (Nigerian Army) anwụchịkọọla otu nwaanyị na-agba mgbere ụmụaka (child trafficking) na steeti Enugu.
Ụmụaka iteghete ka e kwuru na a zọpụtara site n’aka nwaanyị ahụ onye nke e kwuru na ọrụ ya bụ ịkpọrọ ụmụaka a tọtara na steeti Plateau wee ziga ha steeti Rivers.
Ndị agha kọwara na nnwụchịkọ ahụ sitere na ihe ha kpọrọ ‘Exercise Atilogwu Udo I’ bụ nke a nụrụ site n’ozi si n’aka Col. Aliyu Yusuf bụ osote onyeisi n’ihe gbasara mmekọrịta ọha na eze (Deputy Director, Public Relations, 82 Division of Nigeria Army).
Yusuf kwuru na ụmụaka iteghete ndị ahụ gụnyere ụmụnwaanyị anọ na ụmụnwoke ise bụ ndị nọ n’agbata afọ abụọ ruo afọ iri na atọ ka e nwetere n’aka nwaanyị ahụ, onye nke o nyere aha ya dịka Oriakụ Rebecca Nwachi, gbara afọ iri anọ.
Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ n’ime nnukwu ụgbọala bọs nke ‘F.G Onyenwe Company’ ka a nwụchịkọrọ nwaanyị ahụ na ụmụaka ndị ahụ. Nwaanyị ahụ kọwara na ya kpọ ụmụaka ahụ aga site n’ogige ndị enwe nne na nna dị na Jos steeti Plateau wee na-aga na nke dị na Port Harcourt, steeti Rivers.
Aliyu kwuru sị; “Nwaanyị ahụ wepụtara akwụkwọ ikike e jiri aka dee nke otu pastọ tinyere aka na ya nke gosiri aha ụmụaka ahụ. Ma ka a na-eme nnyocha ka onye ezinaụlọ otu n’ime ụmụaka ahụ onye nke a kpọtụụrụ kwuru na ya amaghị ka nwa ha bụ Joshua si rute Nsukka.”
Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ otu a ka e si wee chọpụta site n’aka ndị ọzọ nwe ụmụaka ahụ na agwọ nọ n’akịrịka.
Onye okwupụta okwu ndị agha ahụ kọwara na ndị agha ahụ nyere ụmụaka ahụ ihe oriri ozigbu n’ihi na ha na-ebe akwa na agụụ na-agụ ha.
Ọ kọwaziri na a hafeela nwaanyị na ụmụaka ahụ n’aka ndị uweojii ‘Enugu State Police Command’s Criminal Investigation Department’ (CID) maka nnyocha zuru oke tupu a hanye ha n’aka NATIP.