KEKE Napep bu mmadụ anọ ma burukwa akara ụgbọala KPP-840QV ewerela ọsọ gbabaa n’ime ọwa mmiri ma merụọ mmadụ abụo ahụ ụbọchi Mọnde. Nke a mere n’ihu Anambra Newspepers and Printing Corporation (ANPC), ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa nakwa SportsLight Xtra. Dika e si kọwaa, onye ọkwọ ụgbọala ahụ gbara ọsọ nke ukwuu n’ejideghị njikwa ụgbọala ahụ nke ọma.
Otu onye nọ n’ụgbọala ahụ aha ya bụ Hadi Mohammed sitere na Sarduana dị na steeti Taraba kọwara na ọkarịbeghI otu ọnwa ọkwọ ụgbọala ahụ butere ụgbọala a
N’okwu ya, ọ sịrị “Anọ m n’ime Keke oge ọ na-anya ya. Ọ chọrọ ka ọ tugharịa ibute onye ọzọ ọ maara. E nyere m aka iji gbochie ihe mberede a ma gwa ya ka o jiri nwayọọ tupu ọtụbanye Keke m n’ime ọwa mmiri”.
Mohammed kwukwazịrị na ihe mberede a merụrụ mmadụ abụọ arụ nke onye otu ya a kpọrọ ‘Homeboy’ so na ya.