Pastọ asụgbuola nwunye ya, gbukwaa onwe ya n’ụlọ ụka

0
233

NJINJI jiri n’ụlọụka Ground For God Church ụbọchị ụka gaara aga mgbe Pastọ sụgburu nwunye ya ma gbukwaa onwe ya ka ha na-aka ụka na Mombasa, Kenya.

Ozi si n’aka ndị uweojii kọwara na Pastọ ahụ bụ Elisha Misiko wepụtara mma na ebe ya na nwuye ya nọkọtara ọnụ na ogo mbidi ọlụta ebe ndị ụkọchukwu na-anọ  ma sụọ ya  mma n’azụ na isi. Nwaanyị ahụ nwụrụ ka e bugachara ya ụlọọgwụ Coast General Hospital.

Ndị nọ ka o mere kwuru na Pastọ ahụ gbụkwara onwe ya site n’iji mma ahụ wee bepụ onwe ya olu.

Kọmanda ndị uweojii Kisauni bụ Julius Kiragu kwupụtara na ya bụ ihe mere eme ma kọwakwaa  na a na-eme nnyocha maka ya ugbu a.

Ka o sila dị, e tinyela ozu Pastọ ahụ na nwunye ya n’ọba ozu Coast General Hospital.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here