September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Ụlọọgwụ Abuja ekewaala ụmụejima gbakọtara ọnụ ka ọ gachara ọnwa iri na isii a mụrụ ha

Goodness na Mercy (ụmụejima ahụ), nne na nna ha, ndị minista na ụfọdụ ndị ọrụ National Hospital Abuja

NA Tuzdee ka ndị ụlọọgwụ The National Hospital, Abuja hafere ụmụejima abụọ gbakọtara ọnụ n’aka nne na nna ha dịka e kewachara ha (surgery) n’udo.

  Ụmụejima ahụ bụ Goodness na Mercy ka e kwuru na ha gbakọtara ọnụ site n’obi na afọ mgbe a mụrụ ha.

  Ọ bụ n’ụlọọgwụ Federal Medical Centre (FMC) Keffi, steeti Nasarawa ka a mụrụ ha ka ọnwa Ọgọstụ dị n’abalị iri na atọ n’afọ 2018. Dịka ọ nọdụ ha siri dị, e zigara ha ozugbo n’ụlọọgwụ National Hospital, Abuja. Ka ha nọchara ogologo oge n’ụlọọgwụ ahụ e kewara ha site n’aka ndị dọkịnta maara ihe ekwe na-akụ ma bụrụ nke a nọrọ awa iri na abụọ mgbe a na-ekewa ha.

  Site n’amara Chineke ihe niile gara nke ọma ebe a hafeziri ha n’aka nne na nna ha bụ Michael Edeh Martins na Mariah Martins bụ ndị nke jiri ọńụ wee nara ha.

  Onyeisi ‘Chief Medical Director’ nke ụlọọgwụ National Hospita Abuja bụ Dr Jaf Momah n’okwu nnabata ọ gwara ndị mmadụ ụbọchị ahụ a hafere ụmụejima n’aka nne na nna ha kwuru sị na ndị ụlọọgwụ ahụ kpebiri ihụ maka ego banyere ụmụejima ahụ n’amụma ha kpọrọ ‘Corporate Social Responsibility’ (CSR).

  Ndị bịara emume ahụ gụnyere Minista na-ahụ maka Ahụike, Osagie Ehanire; Minista steeti maka Ahụike, Olorunnimbe Mamora; Minista na-ahụ maka ọdị mma ụmụnwaanyI,Pauline Tallen;

 Odeakwụkwọ Ọkpụtọrọkpụ ngalaba Ahụike, Abdullahi Mashi na ndị ọzọ tinyere ndị ọrụ National Hospital Abuja, ọ kachasi ndị ọrụ ahụike mere ya bụ nkewa bịara ma ńụrịkwaa maka ya bụ ihe.

  Dr Momoh kọwara na ụlọọgwụ ahụ tinyere ihe ruru nde naira iri abụọ (20 million naira) maka ihụ na a zọtara ụmụejima ahụ.

  Minista na-ahụ maka Ahụike Dr Osagie Ehanire kwuru na obi dị ya ụtọ maka ya bụ nkewa e mere ụmụejima ahụ.

  O kwuru na nke ahụ gosịrị na Nigeria nwere ihe niile iji tụnye ụtụ n’ụwa n’ihe gbasara ahụike. O toro ụlọọgwụ ahụ maka ọrụ ọma ha.

  Onyeisi ndị mere nkewa ahụ (the lead surgeon) Ọkammụta Emmanuel Ameh kwuru na e mere nkewa ahụ ka ọnwa Nọvemba 2019 dị n’abalị iri na anọ bụ mgbe ụmụejima ahụ dị ọnwa iri na ise. O kwuru na ọ bụ ndị ọrụ ahụike maara ihe ekwe na-akụ dị iri asaa na asatọ jikọtara aka ọnụ wee kewaa ụmụejima ahụ.

  Ọ gara n’ihu kwuo na nke ahụ bụ nke izizi n’ala Nigeria ha na-ekewa ụmụejima gbakọtara ọnụ site n’obi na afọ.

  Minista na-ahụ maka ọdị mma ụmụnwaanyị, Pauline Tallen toro Chineke maka nkewa ahụ. O kelekwara ndị ọrụ ụlọọgwụ ahụ maka mbọ ha.

 Ọ gara n’ihu nye nne ụmụaka ahụ ọrụ ozugbo n’ihi na ọ nụrụ na o nweghị ọrụ.

  Nna ụmụejima ahụ bụ Martins kelere Chineke maka iji ndị ọrụ National Hospital Abuja wee zọpụta ụmụ ha.

%d bloggers like this: