OTU nzukọ na-ahụ maka ọchịchọ na adịmma ụmụakwụkwọ nke mahadum ‘Student Union Government’ Nnamdi Azikiwe University, Awka ajaala aka na-achị steeti Anambra, Gọvanọ Willie Obiano ike dịka onye ji ezi nchekwa na adịmọcha gburugburu wee kpọrọ ihe.
Ọ bụ otu onye welitere isi n’ọchịchị ụmụakwụkwọ ahụ, aha ya bụ Attorney General JohnBosco Okonkwo kwuru okwu a na Satọdee gara aga mgbe a na-eme mkpocha na nzacha nke ha kpọrọ “Go Clean Unizik”.
Onyeisi otu ‘SUG UNZIK’ n’aha ichafu, bụ Maazị Samuel Chimuanya kwuru na obi dị ya ụtọ otu ndị mmadụ siri wee puta n’igwe ihụ na mkpocha na nzacha ahụ gara nke ọma otu e siri kwado ya.
N’akụkụ nke ya, onye ọrụ ASWAMA na-ahụ na mkpocha na nzacha na-aga n’ihu, Maazị Ogochukwu Aghadinuno, onye a hụrụ mgbe ya na ndị ọrụ ndị ọzọ na-ekpocha atịtị, dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha nwee agwa idobe gburugburu ọcha oge nille ma rịọkwaa ndị bi n’ogologo ụzọ Ifite ka ha sonyere otu goomenti ụmụakwụkwọ ahụ n’ihu maka adịmọcha ebe ahụ niile.
Na ndụmọdụ ya, onye otu ndị goomenti SUG, na-ahụ maka adịmọcha n’ogige ụlọakwụkwọ ahụ, Comr. Ifeanyi Obiesili, kwuru na ọ dị oke mkpa ị na-awufu ahịhịa ebe o kwesiri nakwa ịsụchasi oke ọhịa na iwepu ihe ndị ga-emeru mmadụ ahụ.