Atụmatụ mmiri mpaghara Otuocha ga-amalite ọrụ n’ọnwa April – Obianọ

0
222

AKA na-achi steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwuola na atụmatụ mmiri mpaghara Otuọcha, bụ nke a maara dịka “Otuocha Regional Water Scheme” ga-amalite ịrụ ọrụ tupuu ọnwa April nke ahọ a.

  Gọvanọ Obianọ mèrè ka ụwa mara nke a n’okwu ya oge ọ gara njem ileta ka ọrụ si aga n’ihu ọrọ ahụ dị n’okpuru ọchịchị ‘Anambra East,’ bụkwa ebe ọ nọrọ wee kọwaa afọ ojuju ya bànyere ogoogo e ji arụ ya.

  Ọ kọwara na ya bụ atụmụtụ mmiri ga na-ekesàra obodo atọ mmiri, nke gụnyere Agụleri, Ụmụeri na Ụmụọba-Anam ma ọ bụrụ na a rụchaa ya, ebe àgbà nke abụọ ya ga-ekesàra obodo asatọ ndị ọzọ mmiri, ma bụrụkwa nke a ga-amalite ọrụ na ya n’ọnwa Ekeresimeesi ahọ a.

  O kwuru na atụmatụ ọrụ mmiri ahụ ga-enye aka kwalite ọnọdụ adịmọcha, bèlata arụrụ nsị na ịga mposi ebe ekwesighị ekwesi, tinyere ọtụtụ urù ndị ọzọ dị iche iche ọ ga-ewèta, ma mekwazie ka a mara na steeti ahụ akwụọla ego nke o kètàrà ịkwụ n’amụmà ọrụ ahụ, n’ihi na ọ bụ nke a na-arụ site na njikọaka steeti ahụ òtù mba ụwa ‘European Union.’

  Na ntụnye nke ya, onye nnọchite anya òtù ‘European Union,’ bụ Maazị Hannes Mostert kọwàra etu atụmatụ ọrụ mmiri ga-esi na-arụ ọrụ nakwa otu ọ ga-esi na-ekesàra obodo dị iche iche ga-erita urù na ya mmiri, ma a rụchaa ya.

  N’akụkụ nke ya, onye ji ọrụ ngo ahụ, bụ Maazị Paul Enidom kèlèrè ọchịchị steeti ahụ maka ezi ntụkwasị obi o nwèrè n’ebe ụlọ ọrụ ya dị, wee nye ya ọrụ ahụ, ma rịọkwazie arịrịọ maka ndị ọrụ nchekwa ga na-echekwaba akụrụngwa ahụ ma a rụchaa ya, iji mee ka ọ dị ọkpụtọrọkpụ.

  Dịka nkọwa ya siri dị, atụmatụ mmiri mpaghara Otuọcha bụ nke ga na-amịta mmiri site n’ohimiri Ọmambala (a maara dịka Ọmambala River), ma bụkwụkwa nke nwere ikike ịdị na-agwọ mmiri ruru ndè lita iri kwà ụbọchị.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here