OTU dinta aha ya bụ Kehinde Edward ezutela ọnwụ ya dịka ha gara ịgba nta n’ime ọhịa. Ọ bụ ogbo ya Kehinde Adeleke gbara ya egbe n’isi.
Ya bụ ihe mere n’ime ọhịa n’Ere Ijesa bụ obodo dị n’okpuru ọchịchị Oriade na steeti Osun dịka ndị dinta nukọọrọ n’igwe waba n’ime ọhịa igba nta.
A kọwara na ka ọ gatarachara nkeji olemole ndị dinta ahụ malitere ịgba ụmụanụmanụ n’ime ọhịa ahụ ka ha nụrụ ka onye otu ha tiri mkpu nke mere ka ha gbara ọsọ gaa ebe ọ nọ. Ọ bụ mgbe ha gbaruru ebe ahụ ka ha hụrụ ozu ya ka o togbozi ma nwee mmerụ ahụ n’isi ya; nke sitere na mgbọ egbe.
Ya mere, ndị dinta ahụ ji obi mwute na iru ụjụ laghachi n’ime obodo wee kọwaara ndị isi obodo ihe merenụ.
Onye uweojii na-ahụ maka mmekọrịta ha na ndị mmadụ (Police Public Relations Officer) na steeti ahụ Folasade Odoro onye kwuru na ya bụ ihe mere n’ezie kọwara na a dọnyere ozu dinta ahụ nwụrụ anwụ n’ọba ozu ụlọọgwụ Wesley Guild Hospital, nke dị n’Ilesa.
Odoro kwukwara sị; “Kọmishọna uweojii bụ Johnson Kokumo enyela iwu ka e bido nnyocha maka ya bụ ihe.”