September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Ebiputala akwụkwọ ọhụrụ maka ndụ Sir Gauze

OTU ochie dike maara ihe ekwe na-akụ egosila ụwa akwụkwọ e dere maka ndụ ya. Ọ bụ Sir Ephraim Chukwugozie Anyachebelu onye nke a makwaara dịka Sir Gauze.

  Akwụkwọ ọhụrụ ahụ a kpọrọ ‘A Man of Indubitable Generosity’ ka a nọrọ n’ụlọ oriri na ọńụńụ Cihcotel Classique Hotel Ltd wee gosiputa.

  Nwunye ya nọ wee na-ahụ na ihe gara nke ọma n’ihi na nwoke ọ bụla na-aga n’ihu nwere ezigbo nwaanyị nọ ya n’akụkụ. Ya mere, Ọkammụta Faith Ebelechukwu Anyachebelu, onye Chineke ji ụmụ ise wee gọzie  ya na Sir Gauze nọ ya.

  N’okwu mmalite, onyeisioche mmemme ahụ bụ Dọkịnta Emma Emelumadu kọwara Sir Gauze dịka ezigbo mmadụ nke mmiri apụghị ịmachị nzọ ụkwụ ya n’ụwa.

  Ọ gara n’ihu too onye dere akwụkwọ ahụ bụ Rev Chukwukaodinaka Godsfavour  Oragu, onye nke wepụtara oge ya wee depụta maka agbambọ nke Sir Gauze.

  Emelumadu kpokukwara ndị otu Kriast ka ha soro nzọụkwụ Sir Gauze.

N’akụkụ nke ya, nnukwu ụkọchukwu (The dean emeritus and retired Archbishop) Most Rev Maxwell Anikwenwa kelere Chineke maka ọganihu nke Sir Gauze, tinyekwara ahụike na amara o nyere ya nke o ji nwee ike kọwapụta maka ndụ ya oge ọ ka nọ n’ụwa.

  Ọ gara n’ihu kpee ekpere ka Sir Gauze si n’ike na-aba n’ike ma kpọkuo ọha na eze, ọ kachasị ndị ọ dị n’aka ka ha gbasoro nzọ ụkwụ ya.

  ‘Rev Dr’ Chukwukaodinaka Oragu rụtụrụ aka na Sir Gauze bụ onye nwe Gauze Pharmaceutical and Laboratories Limited, ya mere na ọgbakọ ahụ bụ iji gosipụta ma ńụrịa n’ihi ndụ ọma ya. O kwuru sị; “Anyị ga na-ama otu anyị si ebi ndụ, tinyere otu ndị mmadị si ahụta anyị.”

  Sir Gauze n’aha ezinaụlọ ya kelere mmadụ niile bụ ndị bịara soro ya ńụrịa, ma rịọ ka Chineke dulaa ha n’udo n’ụlọ ha dị iche iche. O kwuru sị; “Obi bụ m sọ ańụrị taa ị hụ unu. N’aha nwunye m na ụmụ m ana m ekele unu. Ndụ e biri nke ọma na ọganihu e nwetara nke ọma kwesịrị  ka a ńụrịa na ya n’agbanyeghị ngalaba anyị dị iche iche.”

  Sir Gauze gara n’ihu kelee Most Rev Maxwell Anikwenwa onye nke chiri ya echiche naịtị (knight) nke St Christopher (KSC) n’ụka Anglican, n’òtù ndị mbụ e chiri na dayọsis Awka n’afọ 1996; ma bụrụkwa onye nke nọ na-agbaziri ya na ọtụtụ ndị ọzọ.

  Nnukwu emume ahụ kpọkụlọtara ọtụtụ ndị mmadụ ndị gụnyere onyeisi ikpe steeti Anambra, ‘Hon Justice’ O.M Anyachebelu, Igwe Ben Emeka (Okebo II of Umueri), kọmishọna na-ahụ maka mmụta na steeti Anambra, Kate Omenugha, onyeisi ụlọọrụ ANPC, Sir Chuka Nnabuife, òtù ndị naịtị na ọtụtụ ndị ọzọ obodo jiri biri.

%d bloggers like this: