ỤLAGA sị na ọ bụrụ na ya apịaghị ụtàrị, ụmaka anaghị ama na ya bụ mmanwụ.
N’ịgbasò nke a, ndị obodo Eziowelle dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Idemili North’ nke steeti Anambra akpọọla gànịganị ma dochie ka idè mmiri n’obi gọọmenti dị n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ, n’ihi nsogbu ọchịchị na-adapụta n’obodo ahụ.
Ya bụ ịkpọ ganịganị bụ nke ndị ahụ bugasị akwụkwọ e dere ihe dị iche iche na ya wee mee, nke gụnyere “Anyị achọghịzị ọchịchị nchịgbu n’Eziowelle,” “Anyị na-arịọ ọchịchị nchereoge ugbua,” “Owelle nke abụọ n’Eziowelle na-emebisi obodo ahụ” na ihe ndị ọzọ dị otu ahụ, bụ nke ha sitere na ya wee na-ekwu na onyeisi ọchịchị obodo ahụ bụ nwoke obi kpọkịrịkpọ, ma bụrụkwa onye amaghị ahàzi ego.
N’okwu ya bànyere nke ahụ, onye duru ndị ahụ wee bịa ya bụ ịkpọ ganịganị, ma bụrụkwa onye kwuru okwu n’aha ha, bụ Maazị Anthony Chigbo kọwara na ebumnobi ha jiri bàgide na ya bụ iji wee wèta udo tọrọ àtọ na mmepe n’Eziowelle, site n’ụzọ iwu kwàdòrò.
O mere ka a mara na ihe adagharịala n’obodo ahụ n’ihi ajọ ọchịchị nchịgbu nke onyeisi ọchịchị obodo ahụ ugbua, bụ Maazị Titus Akpudo, ma kpọkuo gọọmenti steeti ahụ ka ọ napụ ya bụ nwoke akwụkwọ ikike ọchịchị ya.
Ọ sị na ya bụ onyeisi ọchịchị obodo ahụ enweghịzịkwa nkwàdo ndị ọ na-achị, ma kwuokwa na ọ na-eji akàrà ụlọ nchekwa ego nke ya wee na-eme ihe gbasaara ego obodo ahụ, nke mezịrị na ọ kọwàbèrèghị ụmụafọ obodo ahụ otu ya na ego siri gaa, kemgbe ahọ atọ o jiri bànye n’ọkwa ọchịchị.
Dịka ọ na-akọwara ọchịchị steeti ahụ na ihe e kwuru bànyere nhọpụta ọchịchị obodo ahụ e mere n’ọnwa Juunu ahọ gara aga abụghị ka o siri mee; Maazị Chigbo rịọrọ Gọvanọ Obianọ, n’aha ndị obodo ahụ, ka gùzobere ha ndị ọchịchị nchereoge n’obodo ahụ, bụ ndị ga-akpa nkata ma tụpụta atụmatụ otu a ga-esi megharịa nhọpụta ọchịchị ọzọ maka obodo ahụ.
Na nzaghachi ya, n’aha gọọmenti steeti ahụ, onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ n’ihe gbasaara echichi na ọchịchị ime obodo, bụ Oriakụ Vera Okonkwọ kèlèrè ndị ahụ maka ime ngagharị iwe ahụ n’ụzọ udo nakwa n’usoro iwu kwàdòrò.
O kwùrù na ya ga-eburu mkpesa ha niile bugara Gọvanọ Obianọ iji lebàá ya anya, ma kwekwazie nkwà na a gà-eleru okwu ahụ anya ọsọọsọ, ma mee ihe bànyere nke ahụ, dịka o siri kwesi.
Ọ rịọkwazịrị ndị ahụ ka ha wetùó obi, ma gaa n’ihu ịbụ ndị na-erubere iwu isi, n’ihi na ọ bụ ire ọma ka ejula ji aga n’ogwu.