NDỊ òrù ahụ jikọtara ndị ọrụ oyibo nọ n’ogoogo dị elu na mahadum Unizik, bụ ndị a mààrà dịka ‘Senior Staff Association of Nigerian Universities (SSANU,UNIZIK)’ akpọkuola gọọmenti steeti Anambra nakwa isi ọchịchị mahadum Unizik ka ha welitekwuo aka na mbọ ha na-agba ịhụ na a tọhàpụrụ ótù onye òtù ha bụ Maazị Emeka Chiaghana, onye ndị ntọ tọọrọ kemgbe ahọ gara aga.
Ndị òtù a kwupụtara nke a na ngagharị iwe ha mere n’ụzọ udo bànyere nke ahụ, bụkwa nke ha bùùrù wee gaa n’obi gọọmenti dị n’Awka, ebe ha nọ wee kpọọ òkù ka a gbasikwuo mbọ ike ịhụ na a tọhàpụrụ nwa amadi ahụ nke ta nke echi.
N’okwu ya banyere nke ahụ, onye ndu ndị òtù ahụ, bụ Oriakụ Nwangwu kwuru na ndị oji egbe ezu tọọrọ ya bụ nwoke n’abalị iri na ise nke ọnwa Ọkụtoba ahọ gara aga n’ebe obibi ya dị na Nibo, n’okpuru ọchịchị ime obodo Awka South nke steeti ahụ; ma kemgbe ụbọchị ahụ, mmadụ ahụbeghị ya anya, ma ya fọdụzie ịnụ olu ya, ruo taa.
O kèlèrè gọọmenti steeti ahụ na mahadum Unizik maka mbọ ha gbàgòrò iji hụ na ha zọpụtara nwa amadi ahụ na ndụ site n’aka ndị ji ya, ma kpọkuo ha ka ha gbasikwuo mbọ ike bànyere nke ahụ iji napụta ya ọsọọsọ, ka ọ lakwuru ezinaụlọ ya, n’ihi na o nweghị onye maara ihe ọ na-agabiga ebe ahụ ọ nọ n’aka ndị tọọrọ ya.
Na nzaghachi ya n’aha gọọmenti, odeakwụkwọ ukwu gọọmenti steeti Anambra, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ mere ka a mara na gọọmenti mààrà bànyere ya bụ ihe ha jiri maka ya wee bịa, ma kwuo na ha na-agbasi mbọ ike ma na-emekwa nnyocha zoro ezo bànyere nke ahụ, iji hụ na a zọpụtara ya bụ nwa amadi na ndụ.
O mere ka a mara na gọọmenti na ezigara onyeisi mahadum ahụ, bụ Ọkammụta Charles Okechukwu Esimone ozi na mgbe na mgbe bànyere nnyocha ha na agbambọ ha, ma sị na ozi nke ikpeazụ ha zìgààra ya nso-nso a bụ n’abalị asaa nke ọnwa Jenmwarị ahọ a. Ọ dụkwazịrị ndị ahụ ka ha wetuo obi, ma kwekwazie ha nkwa na gọọmenti steeti ahụ na ndị ọrụ nchekwa agaghị arahụ ụra maọbụ gba nkịtị, rukwaa mgbe a napụtara Maazị Chiagahana n’aka ndị tọọrọ ya.
N’akụkụ nke ya, onyeisi ọrụ nchekwa na mahadum Unizik, bụ Maazị Lawman Okeke, ónyé gwara ndị ahụ okwu n’aha onyeisi mahadum ahụ, kèlèrè ha maka mmetụta ha na agbambọ ha bànyere ọnọdụ ahụ, ma mekwazie ka ha mara na a nwụchikọọla ụfọdụ n’ime ndị aka ha dị na ntọrọ ahụ a tọọrọ ya bụ nwoke.
Ọ gwakwazịrị ha na nnyocha ka na-aga n’ihu, ma kwe ha nkwa na isi ọchịchị mahadum ahụ ga-aga n’ihu ịgbasi mbọ ike banyere ọnọdụ ahụ, rukwaa oge Maazị Chiaghana nwèèrè onwe ya pụọ n’aka ndị ji ya, maka na ọnụ anaghị ezù ike ma ihe ọ na-ata agwụghị.