Nnabuife ebunye ụlọakwụkwọ Ubuluisiuzo ngwa egwu bandị

0
516

OKE ọńụ dara n’ụlọakwụkwọ Community Primary School, Ubuluisiuzo dịka Sir Chuka Nnabuife, onyeisi (MD/CEO) nke Anambra Newspapers and Printing Corporation, Awka bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akukọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra bunyere  ndị nlekọta na ụmụakwụkwọ ahụ ngwa egwu bandị (ịgba) dị iche iche (new sets of drums).

  Ya bụ oke mmemme nke a nọ n’ụlọ ezumezu ụlọakwụkwọ ahụ wee me kpọkọtara ọtụtụ ndị mmadụ ndị gụnyere nne na nna na ndị nlekọta ụmụakwụkwọ, ndiisi obodo na ndị na-ahụ maka mmụta n’okpuru ọchịchị Ihiala.

  N’okwu ya na mmemme ahụ, odogwu nwoke ahụ meere ha ihe ọma bụ Sir Chuka Nnabuife, onye gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ kwuru na ọ bụ mmasị o nwere n’egwu (music) na ezi nkuzi na mmụta kpalitere ya maka inye ha onyinye ahụ. O kwukwara na ọ chọrọ ka ụlọakwụkwọ ahụ nwee ezigbo ngwa egwu dịka ụlọakwụkwọ prima ndị ọzọ gbara ha gburugburu. O kwekwara nkwa Ị na-agba n’ihu n’inyere ụlọakwụkwọ ahụ bụ sọ ụdị ya n’obodo ahụ aka.

  O kwuru sị; “Ihe ọzọ bụ na achọrọ m ka Ubuluiziuzo Primary School dị ka ụlọakwụkwọ ndị ọzọ dị na gburugburu ya, ma nwekwaa ngwa egwu nke mere, dịka m na-enye ha bandi a ka m na-ekwekwa ha nkwa ịga n’ihu na-enyere ha aka.

  Eji m mmasi ekwuputa na agụrụ m na Community Primary School, Ubuluisiuzo nke bụ obodo m. Nke a bụ sọọsọ ụlọakwụkwọ prima dị n’Ubuluisiuzo ma bụrụkwa ụlọakwụkwọ izizi n’obodo a. Ekwenyere m n’amụma ‘Akụluoụnọ’. Ekwenyere m n’isite n’ụlọ maba mma. Ọ bụrụ na i nwere ike ime ihe ebe ọ bụla, buru ụzọ mee ihe ahụ ma ọ bụ karịa n’obodo gị.”

GUO:  Nnabuife egosila ndị ntaakụkọ akwụkwọ atọ o dere ọhụrụ

  Oge ụmụakwụkwọ ahụ letere ịgba (bandị) ndị ahụ site n’ịkụtụrụ ya ka ọha na eze nụrụ, Nnabuife ji ọńụ kọwaa na ịgba ndị ahụ ga-enye aka n’ịgbaziri ụmụaka ahụ ụzọ ha ga-eso na ndụ ha ebe ụfọdụ nwere ike ịbụ ndị oti egwu, ndị agha w.d.g.

  Igwe John Ozulumba bụ eze na-achị Ubuluisiuzo, onye nke Onowu Alfred Mbanaso nọchitere anya ya toro Nnabuife maka onyinye amara ahụ ma kpekwaara ya ekpere.

  Maazị Sunday Mbaukwu bụ onyisi nzukọ (President General) Ubuluisiuzo Progressive Union (UPU) kelere Sir Nnabuife ma kpọkue ndị ọzọ obodo jiri biri ka ha gbasoro nzọ ụkwụ Nnabuife iji wee tinye obodo ha n’ogo dị elu.

  Mbaukwu gara n’ihu dụọ ụmụakwụkwọ ahụ ọdụ ka ha ghara iji agụmakwụkwọ ha gwuo egwu ka ha wee nwee ike otu ụbọchị mee dịka Chuka Nnabuife.

  N’otu aka ahụ, ụkọchukwu parish nke St John’s Catholic Church, Ubuluisiuzo ma bụrụkwa onye nlekọta (manager) ụlọakwụkwọ ahụ Rev. Fr. Felix Umegbolu kọwara Sir Chuka Nnabuife na nwunye ya dịka ndị a maara nke ọma n’ụlọụka ahụ.

  Dịka ụkọchukwu ahụ siri kwu, ha atụnyela ọtụtụ ụtụ n’ụlọụka ọhụrụ nke ha na-arụ.

  Fr Umegbolu rịọrọ Chineke ka ọ gọzie ha maka ịkwado ụlọụka na ụlọakwụkwọ ebe ọ gụrụ (alma mater)

  Oriakụ Fidelia Obi, onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ (headmistress) gosịrị afọ ojuju ya n’afọ ọma Nnabuife gosịrị ha site n’ibunye ha ngwa egwu ahụ n’ihi na dịka o siri kwu ọ bụ otu n’ime ihe ndị na-akpa ụlọakwụkwọ ahụ.

  Onyeisioche otu jikọtara nne na nna na ndịnkuzi (PTA) Maazị Sylvester Mgbe na onye ọzọ bụ Hon. Emmanuel Nnabuife n’okwu ha dị iche iche gosipụtara ọńụ ma kwuo na ya bụ ihe amaka ma bụrụkwa nke kwesịrị nńomi.

GUO:  Nnabuife ebuputala akwụkwọ atọ o dere ọhụrụ

  Onyeisi mmụta (Chief Education Officer) n’okpuru ọchịchị Ihiala, Lady Ethel Ileka onye nke Maazị Anthony Ndubeze nọchitere kelere Sir Chuka Nnabuife maka ịgbasoro amụma ‘Akụluoụnọ’ nke aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano, iji nyere obodo ya aka.

  Amaghere Onyinye na Asoegwu Chinaza bụ ndị kwuru okwu n’aha ụmụakwụkwọ ahụ kelere Nnabuife maka ibunye ụlọakwụkwọ ha ngwa egwu ọhụrụ. 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here