AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ akpọkuola gọọmenti etiti ka ọ gbatara steeti ahụ ọsọ mberede n’ihe gbasaara ajọ ọnọdụ mbize na-akpa ike na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.
Gọvanọ Obianọ, onye gara ileta ka ọrụ si aga n’ihu ọrụ mbize ‘100-Foot Road Nnewi’ n’Uruagụ Nnewi dị n’okpuru ọchịchị obodo ‘Nnewi North’ kpọrọ oku a n’ebe ahụ, ma kọwakwazie na ọchịchị steeti ahụ enyela ụlọ ọrụ IDC ọrụ ngo ịrụ mbize ahụ, bụ nke o kwuru na ọ ga-egbu ego dị ijeri Naịra atọ.
O mere ka a mara na mbize eweela ka onye nwenụ ga-ama n’Anambra ma kpakọrọsịkwa ọtụtụ àlà, na-agbanyeghị na steeti ahụ so na steeti kachara nwee ntàkịrị ụbara ala na Nigeria.
Ọ sị na n’ime mbize ruru narị iteghete na iri asaa dị na steeti ahụ, na ọ bụ naanị n’iri na isii ka gọọmenti steeti ahụ jì ọrụ ọrụ n’aka ugbua, site na njikọaka ya na ụlọ ọba ego mba ụwa, bụ ‘World Bank.’
Ọ kpọkuzịrị gọọmenti etiti ala anyị ka o kwuwaa ọnọdụ mbize na steeti ahụ dịka nke chọrọ mgbataọsọ mberede, iji wee memìlaa ma busoo ya agha aka ọkụ aka ọkụ.
N’okwu nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ ngo ‘IDC Construction Company’ bụ Maazị Freddy de Kleyn kwùrù na ụlọ ọrụ ahụ ga-agbasi mbọ ike ịkpà mbize ahụ eze, ịrụ ọrụ ahụ n’ogoogo dị elu, nakwa ịrụchàpụ ya n’oge kwesiri ekwesi, dịka nkwekọrịta ya na gọọmenti steeti ahụ siri dị.
O kwupụtàkwàrà ezi olileanya o nwèrè na ha na ndị Nnewi ga-emekọrịta nke ọma n’ogologo oge niile ha ga-arụ ọrụ ebe ahụ.
N’okwu ya n’aha ndị Nnewi, odeakwụkwọ mgbasa ozi òtù Nzukọ-Ọra Nnewi, bụ Maazị Augustine Ike bùnyèrè Gọvanọ Obianọ na ọchịchị steeti Anambra ụkpa ekele maka mgbata ọsọ ya na mbize ahụ, bụ nke nyegoro ha nsogbu ọtụtụ ahọ, ma kwuo na ha ga-enye ndị ọrụ ahụ nkwàdo ọbụla ha chọrọ n’ozuzu oke, iji hụ na o nweghị ihe ọbụla gbaghàchiri aka elekere azụ n’ịrụchapụ ọrụ ahụ.