NDỊ uweojii anwụchikọọla nwaanyị onye oziọma ụgha, na-atọrọ ụmụaka n’ụlọụka dị iche iche.
Nke a pụtara ihe na Port Harcourt, isi obodo steeti Rivers ka nwata na-arahụ ụra na ngalaba ụmụaka (children department) nke ụlọụka Assembly of God Church Rumuepirikom, Port Harcourt furu ka a na-aka ụka.
Aha nwata nwoke ahụ bụ Dominion Igwe ma bụrụ onye gbara ọnwa iri na asaa.
Nke a gbagwojuru ndị ụlọụka ahụ anya ebe nna nwata ahụ na-efu efu bụ Eze Nnabugo Igwe nke Egbada dị n’okpuru ọchịchị Onelga na steeti ahụ kpesaara ndị uweojii bụ ndị fooro ntutu ha taa wee malite chọba ya bụ ihe danyere na mmiri n’ike n’ike.
Otu a ka e si wee chọpụtazi onye zuuru nwa ahụ; wee si n’aka fere aka refuo ya. Ọ bụ otu nwaanyị onye oziọma (evangelist) na Word Ministry Church, Grace Azikiwe batara n’ime ụlọụka Assemblies tọrọ nwata ahụ site n’ikuru ya ebe ọ na-arahụ ụra pụọ. Ọ kọwara na ya ezurula ụmụaka karịrị iri n’ọnụọgụ site n’ụlọụka dị iche iche na Port Harcourt.
Azikiwe, onye steeti Akwa Ibom kwuru na mgbe ya na-akwado izuru ohi nwa na ya gara na Assemblies of God Church ahụ n’ihi na ya chọpụtara na ha enweghị ihe onyoonyoo CCTV.
Na mbụ, na ya gara ekpere n’ihi na ahụ adịghị nwa ya nwoke nke mere ka enyi ya nwaanyị na-aga ụka ahụ bụ Lillian Chukwudaah kpọgara ya pastọ ha o wee kpeere nwa ya ekpere.
Ọ bụ mgbe ahụ ka o ji chọpụta na ha enweghị onyoonyoo tinyekwara na enyi ya nwaanyị bụ onye na-ahụ maka ngalaba ụmụaka.
O kwuru sị; “Abịaghachiri m ọzọ oge ha na-eme emume owuwe ihe ubi (harvest) wee gaa ozugbo na ngalaba ụmụaka, ebe ọtụtụ ụmụaka dina ala na-arahụ ụra wee kuru otu nwatakịrị pụọ.
Ozugbo ka m kpọrọ Oriakụ Confidence Iheanacho n’ekwentị. Arahụrụ m n’ụlọ ya ebe anyị nọrọ nyochaa nwata ahụ iji chọpụta ma o nwere nje HIV. Enyere m puku narị naịra anọ (400,000) dịka oke nke m.”
Azikiwe gara n’ihu na-ekwu sị; “Eji m aha ‘evangelist’ wee ghọrịa ọtụtụ ụka na otu dị iche iche na Port Harcourt. Eji m ya wee mere ihe mkpuchi m ji ezuru ma na-ere ụmụaka. Kemgbe di m jiri wee nwụọ, anọ m n’ihe isi ike. Eche m na nke a bụ sọọsọ ụzọ m ga-esi wee nwete onwe m n’ụwa.”
Confidence Iheanacho, Love Adumo, Ebere Ugonna Blessing kwetere na aka ha dị n’arụrụ ala a, ma kwuo ego ole a kwụrụ ha n’otu n’otu.
Otu o sila dị, Evangelist Lillian Chukwudaah, nke ụlọụka ahụ gọrọ agụgọ na aka ya adịghị na ya bụ ihe. O kwuru sị na Grace Azikiwe bụ enyi ya nke ya kpọgara ka pastọ ha kpeere nwa ya ekpere n’ihi ọ bịara n’ụlọụka ha gwa ya na ahụ adịghị nwa ya nwoke. Na ọ gbagwojuru ya anya oge a chọpụtara na ọ bụ nwaanyị ahụ zuuru nwa ahụ na-efu efu.
N’akụkụ nke ya, nwaanyị e resịrị nwa ahụ, Regina Brunttey Akuru kwuru na Chief Brown Akuru lụrụ ya dịka nwunye n’afọ 2016 ma ya amụtaghị nwa nke mere na ya kpebiri igote nwa (adoption).
O kwuru sị na ọ bụ Pastọ Patricia Oluji kuteere ya nwa ahụ n’ụlọ ya ka ọnwa Disemba dị n’abali iri abụọ na atọ, na ya jụrụ ya ma nwata ahụ o kutekwara ya n’ụzọ ziri ezi, ọ gwa ya na ha nwere akwụkwọ ikike ya.
Ọ kọwakwara na ya kwụrụ pastọ ahụ narị naịra iteghete wee kpọrọ nwa ahụ dịka nke ya.O kwuru na ya kụjara ka Pastọ Oluji na ndị uweojii bịara n’ụlọ ya ịnwụchikọ ya, ma gwa ya na o goro nwa e zuru n’ohi.
Pastọ Patricia Oluji n’akụkụ nke ya kwuru na ọ bụ Kute Mubana kpọtaara ya nwa ahụ nke ya kpọnyere Regina Brunttey, na ya amaghị na e zuru ya ezu. Na ego ahụ (N900,000) ha kwụrụ na ya zigaara ya Brunttey, na ya ewepụghị ego na ya.
Kute Mubana gbara afọ iri isii na asaa, n’akụkụ nke ya kwetere na ya na-egwu ojoro ire ụmụaka. O kwuru sị; “Pastọ Patricia Oluji jụrụ m ma o nwere nwa m nwere m sị ya ee. Ama m na e zutere nwa ahụ n’ohi. Akpọtaara m ya nwa ahụ, o nye m narị naira iteghete (N900,000), narakwa naịra iri ise (N50,000) dịka oke m.”
Ka ọ dị ugbu a, kọmishọna uweojii steeti ahụ kwuru na a hafeela nwata nwoke ahụ ha zuuru n’ohi n’aka nne na nna ya, ebe ndị niile aka ha dị na ya bụ arụ ga-apụ ụlọikpe.