E KWUOLA ma kwekọrịta na a ga-amalite agba nke abụọ maka ahụike nke a kpọrọ 2019 Maternal, Newborn and Child Health Week (MNCHW) na agba nke mbụ nke 2020 National Immunisation Plus Days (NIPDs) na steeti Anambra.
Ode akwụkwọ ma bụrụkwa onyeisi (Chief Executive Officer), Anambra State Primary Healthcare Development Agency (ASPHCDA) bụ Chioma Ezenyimulu kwuputara nke a na nzukọ State Social Mobilisation Committee nke e mere na Tuzdee na ASPHCDA.
O mere ka a mata na ndị ụlọ ọrụ ahụ na ndị enyemaka ha (partner agencies) ekwekọrịtala ịmalite MNCHW bido ụbọchị ụka ọnwa Febụwari ga-adị n’abalị iteghete wee ruo Fraidee abalị iri na anọ n’afọ a bụ 2020.
Dọkịnta Ezenyimulu gara n’ihu kwuo na a ga-eguzobe amụma ahụike a n’ụlọ ahụike ‘Government Primary Healthcare Centres’ nke gụnyere ụlọọgwụ ọha na eze (general), ụlọọgwụ ọzụzụ (teaching), nke ndị ụka,ndị mmadụ nwe; tinyere ịga n’ụlọ ụlọ, ụlọụka, ụlọakwụkwọ, ahịa, ama obodo, ọdụ ụgbọala nakwa ebe ọ bụla e nwere ike ịhụ ụmụaka.
Dịka o si kọwa, ndị ga-eketa oke n’ọgwụ ‘Vitamin A’ na ọgwụ okpo n’oge MNCHW bụ ụmụaka dị ọnwa isii ruo afọ ise, ebe ụmụaka a mụrụ ọhụrụ wee ruo na ndị dị ọnwa iri ise na iteghete bụ ndị ga-anata ọgwụ mgbochi ọrịa polio n’agbanyeghị ma ha anatala mbụ.
O kwukwara na amụma ọgwụ mgbochi maka ụmụaka ndị a mụrụ ọhụrụ ruo na ndị dị ọnwa iri na ise ga-adịkwazi ka o si adị.
Ọ gara n’ihu dụọ ụmụnwaanyị dị ime na ụmụnwaanyị ndị nọ n’agbata afọ ịmụ nwa; yaabụ ndị rugoro ogo ịmụ nwa ndụmọdụ ka ha kpọrọ ụmụaka gaa ụlọ ahụike dị ha nso maka MNCHW maka ihe ndị so ya bụ nke gụnyere, ọgwụ Vitamin A, nleta ndị dị ime, nhazi ịtụ ime (family planning), ideba aha (birth registration), ọgwụ mgbochi, ọgwụ okpo maka ụmụaka w.d.g.
Ọ kpọkuru nne na nna, ndị isi ụlọakwụkwọ, ndị ndu ụka na ndị ọzọ ka ha gba mbọ nye ndị ọrụ ahụike ohere ịbata n’ụlọ ha maka ya bụ ọrụ ka ha wee nwee ike inweta ụmụaka niile.
Dọkịnta Ezenyimulu jikwaziri ohere ahụ kwuo na a ga-agbaga ọsọ enyemaka nso nso n’okpuru ọchịchị Onitsha South na Anambra East n’agbata Satọdee ọnwa Febụwarị ga-adị n’asatọ wee ruo Tuzdee abalị iri na otu n’ihi nje polio nke pụtara ihe n’ọwa mmiri Onitsha nso nso a.