ONYE odeakwụkwọ izugbe nke Faculty of Social Science Students’ Association (FOSSSA), Nwada Ekeh Angel Kosisochukwu na njikọta aka ọfiisi odeakwụkwọ mgbasa ozi Students Union Government (SUG), Nnamdi Azikiwe University, Awka akọwapụtala isiokwu a kpọrọ ‘National Development as a Means of Getting the Future Ready for the Youths’.
Ọgbakọ a dọtara ọtụtụ ndị ọrụ e ji okwu ha agba izu n’ụlọakwụkwọ ahụ dịka Dean ‘Faculty of Social Sciences’, Prof. Rita N. Ugokwe Joseph nke onye nọchiri anya ya bụ onye enyemaka onyeisi, School of General Studies, Dr. Mrs Uju Ezenekwe, onye bụ onyeisi Unizik Business School, Prof. A. U. Nnonyelu nke onye nọchiri anya ya bụ onye enyemaka onyeisi,
Unizik Business School, Dr. Tochukwu Oguegbe, onye ndụmọdụ ndị ọrụ nakwa onyenkụzi ngalaba(Department) Psychology, Dr. N. C. Abamara, HOD Guidance and Counseling, Prof. Ada Anyamene nke onye nọchiri anya ya bụ Dr. Nkechi Ofojebe nakwa ndị ọzọ.
A kọwara na asọmpi a bụ nnọọ nke dị n’etịtị ụmụ akwụkwọ ruru ọnụọgụ iri atọ na isii (36). N’oge ahụ, mmadụ iri bụ ndị nwere nturu ugo n’asọmpi a ma bụrụkwa nke mere ha jiri tozue n’asọmpi ikpeazụ ha mere n’ụlọakwụkwọ ahụ.
Nke a pụtara mgbanwe otuto nakwazị mmepe obodo na ụzọ dị ịche ịche gụnyere Otu (Social), Ọdịnala (Cultural) nakwa akụ na ụba (Economic). A kọwara ụzọ dị otu a dịka iji nwee mmepe n’obodo Nigeria ma kwalite ọdịmma ndị mmadu.
N’agba nke abụọ nke isiokwụ ya bụ ‘Insipidity; a problem of African Nation’, a kọwara ya dịka ọnọdụ enweghị agwa na ụkpụrụ butere nke a n’ime obodo Africa ma bụrụkwa nke butere etinyeghị uche na ihe ọ bụla ma ọ bụ mepụta ihe ọpụrụ iche n’etiti ndị mmadu.
N’ajụjụ ọnụ onye ọrụ National Light gbara onye haziri asọmpi ahụ ma bụrụkwa onye odeakwụkwọ ‘Faculty of Social Science Students’ Association (FOSSSA)’, nke Political Science, Nwada Angel Kosisochukwu Ekeh kwuru na ọ bụ iji wee zụlite ndị na-ekwu okwu n’ihu ọha (Public Speakers), tinyere ime ka obi sie ha ike oge ọ bụla.
Ọ gara n’ihu kọwaa onwe ya dịka onye na-eme ihere (naive) oge o perempe mana ọ malitere nwee nkwenye onwe (self-cofidence) oge ọ na-etolite ma na-enwekwa mkparịtaụka n’etiti ndị mmadụ.
“Anyị na-eme nke a iji nye agbamume ma kụzie etu mmadụ kwesịrị isi kwuo okwu mgbe ọ bụla na n’ihu ụbara mmadụ n’ihi na ọtụtụ na-eji atụmegwụ nakwa obi esighi ike hapụ ikwupụta ebumnuche ha ma ọ bụkwanụ zaa obere ajụjụ ọnụ.
Taa, anyị ga-enye onye bụ onye nke izizi onyinye laptọọp, onye nke abụọ ga-anata ekwentị ọhụrụ ‘smart phone’, ebe onye nka atọ ga enwete erere ọma igụ akwụkwọ otu afọ n’efụ. Ndi ọzọ ga- aga n’ihu ịmụ ihe ọmụmụ a n’efu”.
Ndị nwere onyinye n’asọmpi ahụ gunyere Grateful Obiyo, Onyekwena Divine nakwa Wisdom Osigwe.
Oriakụ Ngozi Nworji-Ekeh bụ nne nwada Angel Kaosisochụkwụ Ekeh gara n’ihu kụzie maka ịdị ọcha ma nyekwa ndụmọdụ ka onye ọ bụla kpachapụ anya n’ụdị nri ọ na-eri dịka ịta anụ ọhịa (bush meat) oge ọ bụla ma kọwaa nke ahụ dịka ụzọ mmadụ nwere ike isi bute ọrịa.
“Mgbe ọbụla ichọpụtara na inwere ahụ ọkụ, gaba ụlọ ahụike ka ihụ dọkinta. Ọ ga enye aka nyochaa ahụ gị nke ọma ma nyekwa gị ọgwụ maka ya”.
Nwada Kosisochukwu kelele nne ya bụ Olịakụ Ngozi Nworji-Ekeh ma kwue na ọ bụ nne ya na ahụ na ya na aga n’ihụ oge ọbụla. O kelekwaziri onye ọbụla bịara ọgbakọ asọmụmpi ahụ ma yọọ ka Chineke dulaa ha na udo.