O PEKATA mpe ọbụrụ mmadụ iri abụọ nwụrụ pịị ebe mmadụ iri na isii nwetara mmerụ ahụ ebe ha na-ekwo mmanụ a gọzịrị agọzị ka ha na-ekpe ekpere na Tanzania.
Ọ bụ ka ndị mmadụ gara ekpere ụka ọgbara ọhụrụ (penticostal service) n’otu ama egwuregwu dị n’obodo ahụ a kpọrọ Moshi nke dị na mba ahụ na mgbede Satọdee gara aga ka ya bụ njinji jiri.
Kọmishọna distrikti Moshi bụ Kippi Warioba kwuru na ihe kpatara ihe mberede ahụ bụ n’ihi mgbe ndị ahụ gara ekpere nukọọrọ n’igwe na-agbaga maka mmanụ ngọzị.
Onye chịkọbara ọgbakọ ekpere ahụ bụ Pastọ Boniface Mwamposa onye nke na-akpọ onwe ya ‘the apostle’. Ndị mmadụ gara ekpere ahụ kọwara na ọ bụ mgbe Mwamposa gwara narị kwuru narị mmadụ gara ekpere ahụ ka ha si n’okirikiri ebe a wụsara mmanụ ngọzị ahụ n’ala gafee ka ya bụ ihe ji wee me.
Igwe mmadụ ahụ nukọọrọ gaba ebe a wụsara mmanụ ahụ n’ala ka ha wee nweta ọgwụgwọ nsọ.
Ka ọ dị ugbu a, ndị uweojii kwuru na ha jizi Mwamposa maka ịzara ọnụ ya.
Dịka ya bụ ihe dapụtara n’oge abalị, ndị ọ dị n’aka ka na-eme nnyocha iji chọpụta ma o nwere ndị ọzọ ya bụ ihe metụtara.
Onyeisi ala mba Tanzania bụ John Magufuli zigara ozi mwute ya ma kwuo ka a na-enwe ezi nchekwa n’ụdị nnukwu mmemme ahụ.