NJINJI jiri n’ụzọ ụtụtụ Tuzdee dịka igwe mmadụ iwe na-ewe ( mob) tiri otu nwoke gwoo gwoo ma mụnye ya ọkụ n’ihi na o zuru ohi ọkụkọ.
Nke a mere n’Ekpo Edem nke dị n’okpuru ọchịchị Calabar South na steeti Cross River.
Ya bụ nwoke aha ya bụ Victor ka e kwuuru na o teele o ji ezu ohi n’ogbe ahụ nke mere na iwe na-ewezi ndị mmadụ maka agwa ọjọọ ya.
Otu onye nọ ka ya bụ ihe mere aha ya bụ George Asuquo kwuru sị; “Ya bụ nwoke eteela o ji ezu ihe ndị dị ka batịrị ụgbọala, igwe na-enye ọkụ, na ụmụ anụ ụlọ dịka ọkụkọ n’agbataobi ahụ. Mana ndị mmadụ amarala ihe. Ọ maghị na ndị mmadụ amatala agwa ọjọọ ọ na-akpa n’ogbe ahụ.
Mgbe ndị ọrụ nchekwa (vigilante) jidere ya n’afọ gara aga, a dọrọ ya aka na ntị nke ikpeazụ, mana ọ nụghị. Ya mere, ọ bịara dịka o si eme n’ụzọ ụtụtụ ụbọchị Tuzdee ka o zuru ụfọdụ ọkụkọ, mana ọkụkọ ahụ malitere mebe mkpọtụ nke mere ka ndị mmadụ chọpụta na agwọ nọ n’akịrịka.
Nke a mere ka ha chebiri ya ma jide ya n’ihe dịka elekere anọ ụtụtụ, ha ekweghị ahapụ ya ka ọ lafere n’oge a. Ha egbughị oge tupu ha malite tibe ya ihe ma mụnye ya ọkụ n’ihi ọkụkọ ahụ o zuru.”
Onye uweojii na-ahụ maka ọdị mma ha na ndị mmadụ (Police Public Relations Officer) ASP Irene Ugbo onye kwuru na ya bụ ihe mere n’ezie kwuru na ọdịghị mma n’ụdị agwa ọjọọ a dapụtakwara ọzọ na Calabar.
Irene adịla na mbụ dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kwụsị ịdị na-etinye ikpe n’aka ha kama ka ha kpọgara ndị uweojii onye dara iwu.
O kwuru sị; “Anyị anaghị akwado ndị omekome na ọrụ ha, mana ndị mmadụ kwesịrị ịmata na igbu mmadụ n’enyeghị ohere maka ikpe (jungle justice) megidere iwu, ha kwesịrị ịhafe ndị ahụ n’aka ndị uweojii maka ime nnyocha na ikpe.”