Dịka mmụta so n’otu ihe e jiri mara Steeti Anambra n’ala anyị CHINWENDU UZOATU gbara onyeisioche Anambra State Universal Basic Education Board (ASUBEB) bụ Patrick Ugbaja ajụjụ ọnụ n’ụlọorụ a n’Awka gbasara mbọ dị iche iche ha na-agba maka mmụta.
OLEE otu o si dị mkpa ndị nkụzi na ụmụakwukwo ịbịa akwụkwọ n’oge?
Nke a bụ ihe dịbu adị oge mbụ agaghị akwusị akwusị. ọ baara anyị uru na ndi nkụzi na ụmụakwụkwọ bịara n’oge. Ọ na-eme ka ihe e nwere ime n’ụbọchi gaa nke ọma. A kwụọ n’ahịrị n’ahịrị kpee ekpere akwụkwọ ebido,ihe niile onyenkuzi kwadoro ụbọchị ahụ ọ ga-akuzicha ya. Mana ọ bụrụ na ndị nkụzi na ụmụakwukwo abịaghị n’oge ihe agaghị aga nke ọma.
A bịa na juniọ sekọndiri onyenkụzi ọ bụla nwere oge nke ya, ọ gaghi enwezi ike ịkụzicha ihe ọ kwadoro. Ọ bụrụkwanụ na prima, ọ gaghịkwa akụzizi ihe niile ọ kwadoro. Ọ bụ ya ka anyị bụ ndị ASUBEB na-agbagharị ihụ na ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ na-abia akwụkwọ n’oge.
Olee ihe a na-eme nwata anaghị abịa akwụkwọ n’oge?
Ọ bụrụ na a chọpụta na nwataakwụkwọ anaghị abịakarị akwụkwọ n’oge a ga-agba mbọ mata ihe kpatara ya.ọ bụrụ na junịọ sekọndịrị a na-enwe onye mgbazi (guidance counsellor), o nwere ajụjụ ọ ga-ajụpụta nwata ahụ gbasara ihe mere o jịghị abia akwụkwọ n’oge.
A ga-akpọ nne na nna ya, ọ bụrụkwanụ onye bi be mmaụu, a ga-akpọ ndị ahụ gwa ha ihe a chọpụtara site n’aka nwata ahụ, e si otu ahụ hazie ọnọdụ.
Ma ọ bụrụ abịaghị akwụkwọ n’oge nke na-adapụta adapụta ndị nkụzi ga-enye ntaramahụhụ. Onweghị onye anyị sị ya gbuo mmadụ maka na nwata abịaghị akwukwo n’oge, ahịhịa dị nke ha ga-asụ.
E dechaa aha, ha abakpuo na klaasị, o ruzie oge egwuregwu ha agaa taa ntaramahụhụ dịịrị ha, makana ị sị ya gaa sụba ahịhịa n’ụtụtụ ọ gaghị enwe ike isonye n’ihe ọmumụ a na-enye ha.
Ya mere, ọ ga-emụtụta ya n’ahụ nke ọma na ọ na-arụ ọrụ oge ibe ya na-egwu egwu. Mana ọ bụrụ na ọ karịchaa, ụtalị dị mkpa makana anyị akagbughị ya kpamkpam.
Kedukwanụ maka onyenkụzi anaghị abịa akwukwo n’oge, o nwere ihe a ga-eme ya?
Nke a ị hụrụ anyị nọ ebe a o nwere ụzọ anyi si eme nyocha (monitor). Anyị dị asaa na bọọdụ (board members), otu onye ketere okpuru ọchịchị (L.G.A) atọ. O kulie n’ụtụtụ ọ na-aga na-amata ka ihe si aga n’ụlọakwụkwọ dị iche iche.
Ọ ga-abịa n’oge, anyị nweta ụdị onyenkụzi ahụ, onye nlekọta ahụ ga-enye ya ihe bekee kpọrọ querry. ọ bụrụzie na ọ karia anyị ga-anara ya ego ndị ahụ ọ bịaghị n’oge kwụnyere ya gọọmentị ma ọ bụ enye ya ọnọdụ cheregodu (suspension).
Ya mere, onyenkụzi kwesịrị ịbịa akwụkwọ tupu amalite (assembly). O nwere n’otu ụlọakwụkwọ anyị gara hụ ụmụakwụkwọ ka ha nọ na-akwụgharị n’ezi ma onyenkụzi ha anọghị ya. Klaasị kpọchịrị akpọchị n’ihi na ọ bụ onyenkụzi ahụ ji igodo. Onyekụzi ahụ amaghị na anyị ga-abịa, ọ takwaranụ ahụhụ maka ya.
O nwere enyemaka nne na nna ga-enye n’ọnọdụ a?
Aka nne na nna ga-enye dị. ọ bụrụ na akwụkwọ bidochaa ọhụrụ, ịgaghị ahụ ụmụakwụkwọ mana ndị nkụzi na-anọ ya, ị jụọ nne na nna ha asị gị na akwụkwọ ebidochabeghị nke ọma. Dịka ndị nkụzi bịara, ụmụakwụKWỌ bịakwuo, ọ gịnị jizi nkịta ọnwụ?
Ọ bụladị nnwale a na-enye ụmụakwụkwọ ụbọchị mbụ ahụ e bidoro akwụkwọ, ọ naghị emetụta ha. Nne na nna kwesịrị ịkwado ụmuakwụkwọ n’oge.
Ọtụtụ ụmụaka na-ekirigide onyoonyoo ruo ndeeri, o ruzie n’ụtụtu o teta ụra n’elekere asatọ. Ụmụaka kwesịrị inwe oge ha ji ekiri ihe onyoonyoo na oge ha ji arahụ ụra. Ha kwesịrị ịmụta ihe n’oge.
N’elekere ise nke ụtụtụ ị kwado ha, ndị obere bu nri aga akwukwo imekọbara ha nri, ọ kụọ elekere asaa ha agaba akwukwo.
Olee ihe inwere ikwu maka mbọ aka na-achị Steeti Anambra bụ Govanọ Willie Obiano (Akpokuodike) na-agba na ngalaba mmụta?
Onye ọ bụla na-eweliri Govanọ anyị bu Willie Obiano aka elu. ọ na-amụke na ngalaba niile, ọ bụkwanụ ịgba na mmụta. O na-enye anyị nkwado pụrụ iche, ọ na-agba anyị ume. ka ọ dị ugbu a, o were ndị nkụzi dị narị ise n’ọnụọgụ n’ụlọakwukwo sekọndịrị.
Anyị nwekwara olile anya na ọ ga-emekwa otu aka ahụ n’ASUBEB na mgbe adịghị anya. A bia na Nigeria niile onweghị ndi e ji amanyere Steeti Anambra na mmụta, ụwa niile amarago.
Na nwa mgbe gara aga ka ụlọakwukwo Flora Azikiwe tuuru ugo dịka ọka ibe n’ala anyi ebe onyeisi ụlọakwụkwọ Maria Regina Nnewi bụ ọka ibe, na ndị nkụzi ndị ọzọ ketekwara oke,tinyekwara asọmpi di iche iche ụmụakwụkwọ anyị tuuru ugo dịka ọka ibe na mba ụwa.
Gọvanọ anyị na-akwụ ndị nkụzi ụgwọ n’oge, ya mere ndị nkụzi na-arụ ọrụ n’eleghị anya n’azụ. Ị hụzie ndị nkụzi ha abụrụ sọ mma makana obi dị ha mma. ọ na-eme anyị nke ọma.