… Sị na ọ bụ oke oyi butere ya
OTU nwoke na-arụ ọrụ oyibo na Lafia, steeti Nasarawa aha ya bụ Christopher Chori ekwuputala otu oke oyi ọtụtụ oge udu mmiri siri mee ka o dinaa ọgọ ya nwaanyị (mother in-law) Oriakụ Priscilia Kwange onye bịara ọmụgwọ n’ụlọ ya.
Maazị Silvanus Kwange bụ di nwaanyị ahụ nọ n’oke echiche ugbu a banyere nwunye ya gara ọmụgwọ wee bute afọ ime. Ọ kọwara na kemgbe ọnwa asaa nwaanyị ahụ siri Taraba gaa ọmụgwọ na Nasarawa na ya ahụbeghị ya anya ma ya fọkwa inwe mmekọ.
Akụkọ a nke na-awụ akpatoyi n’ahụ dapụtara dịka nwunye Christopher Chori bụ Faith nwụrụ ka ọ mụchara nwa. Faith bụkwa ada Maazị Kwange.
Ọ bụ ka nne Faith nwụchara ka nna ya bụ Maazị Kwange lụrụ Priscilla. Ka ọ siri dị, kembe ihe karịrị afọ iri Kwange na Priscillia jiri lụ di na nwunye ha amụbeghị nwa.
Mgbe Faith nwụrụ ka ọ mụchaa nwa, Kwange gwara nwunye ya Pricilla ka ọ gaa ọmụgwọ n’ụlọ ọgọ ya nwoke Chori ka o wee lekọta nwa ọhụrụ ahụ nne ya nwụrụ anwụ anya.
Ka ọ dị ugbu a, Kwange nọzi na nwute n’ihe ahụ merenu. O kwuru sị; “Ọ bụ otu enyi m nwoke kpọrọ m n’ekwentị wee gwa m na ọ hụrụ nwunye m n’ahịa Lafia (obodo ọ gara ọmụgwọ) ka o bu afọ ime. Ozi a kụchiri m ọnụ. Achọghị m ikwenye na ọ bụ eziokwu.
Ya mere, ebiliri m gaa ebe ahụ, ka m wee matakwuo ka nwa ọhụrụ mere. Mgbe m batara n’ụlọ ọgọ m, ahụrụ m nwunye m ka o bu afọ ime. Mgbe m jụrụ ya ihe nke ahụ pụtara ọ malitere bewe akwa, kọwa ka ya na ọgọ m nwoke siri malite nwebe mmekọ nke buteere ya afọ ime.”
N’akụkụ nke ya, Chori kwuru na ọ bụ oke oyi ọtụtụ udu mmiri tinyere ya n’ọnwụnwa ahụ. N’ihi na dịka o siri kwu, ọ bụ otu ụbọchị oke oyi tụrụ n’ihi na mmiri zoro n’abali ka ọgọ ya nwaanyị nwara ya ọnwụnwa nke mere ka ha kwaa iko. Ka nke ahụ mechara, ha malitere na-akwa iko mgbe niile nke butere afọ ime.
Nwaanyị ahụ bụ Priscilla n’okwu nke ya kọwara sị; “Ihe m jiri nwaa ọgọ m ọnwụnwa bụ ka m chọpụta ma abụkwa m nwaanyị n’ihi na kemgbe mụ na di m bi afọ iri atụghị m ime. Ahụrụ m ọnọdụ ọmụgwọ ahụ dịka ohere ọma. Ya mere, mgbe m chọpụtara na mụ adila ime achọghị m iwepu (abortion) nwa ahụ n’ihi na amaghị m ma aga m ahụkwa ọzọ echi.”
Maazị Kwange onye nọbụ n’ọrụ agha (military) kwuru na ọ bụrụ oge ahụ na ya gaara eji egbe gbagbu ha abụọ ma otu o sila dị, na ya agaghị ada iwu.
O kwuru na ya agwala nwunye ya ka ọ hapụ ịlọtakwa n’ụlọ ya ọzọ. Banyere ọgọ ya nwoke bụ Chori, o si na ka o dịbara ya na chi ya.