AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ na nso-nso a wee mee mmemme ịgbape atụmatụ izuụka ahụike maka ndị nne, ụmụaka na ndị mụrụ nwa ọhụụ n’Akpo dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Agụata.
Ya bụ izuụka ahụike bụ nke ebumnobi ya bụ iji kwàlite ezi ọnọdụ ahụike ụmụnwaanyị na ụmụaka, mee ka ọ kawanye mma ruo ogoogo pasentị iri ise n’ime ahọ 2020, ma sikwazie n’ụzọ dị otu ahụ memìlaa ọrịa dị iche iche na-arịa ụmụnwaanyị na ụmụaka.
Gọvanọ Obianọ, onye kwupụtàra nke a oge ọ na-agbape atụmatụ ahụike ahụ, kpọkùzịrị ndị nne, ọ kachasị ndị nke mụrụ nwa ọhụụ na ndị ka na-enye nwa ara ka ha kpọpụta ụmụ ha nọ n’agbata ọnwa efù ruo ọnwa iri ise na iteghete, iji sonyesie ike na ya bụ atụmatụ.
O mere ka a mara na ọchịchị ya arụgharịala ma dozigharịa ụlọ ahụike karịrị narị abụọ na iri ise n’ime steeti ahụ, n’ihi ezi mmasị o nwèrè n’ịkwàdò na inwògharị ngalaba ahụike steeti ahụ. Ọ gakwazịrị n’ihu kwuo na ya bụ atụmatụ ahụike ga-ewerekwa ọnọdụ n’ime-ime obodo dị iche iche na gburugburu niile nke steeti ahụ.
Na mbụ n’okwu ya, Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Ọkpala kọwàpụtasịrị uru dị iche iche atụmatụ ahụ ga-eweta, dịka o siri metụta ahụike ụmụnwaanyị na ụmụaka, ma jirikwazie ohèrè ahụ kpọkuo ma dụọ ndị Anambra ka ha chekwaba owe ha pụọ n’ọrịa Lassa Fever site n’ịgbaso ntụziaka ndị ọrụ ahụike nà izèrè ihe ihe dị iche iche nwere ike ibute ya bụ ọrịa.
Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ ‘Anambra State Primary Healthcare Development Agency’ bụ Dọkịta Chiọma Ezenyimụlụ gbàrà akaebe na steeti Anambra na-adị esonyesi ike n’atụmatụ ahụike niile gọọmenti etiti na-atụpụta na mgbe na mgbe.
Ọ mèkwàrà ka a mara na ihe niile gọọmenti kesààra ụlọ ahụike ntà niile dị na steeti ahụ bụ n’efù iji hụ na atụmatụ izuụka ahụike ahụ gàrà siriri-wèrèrè.