
Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma bụrụ ihe oke ọńụ dịka a nọ na Tuzdee ọnwa Febụwarị a dị n’abalị iri na otu wee mee emume icheta otu afọ nke onyeisi (MD/CEO) Anambra State Housing Development Corporation (ASHDC) bụ Arc Willie Okafor nọgoro n’ọrụ.
E mere emume ahụ nke kpọkọtara ọtụtụ ndị mmadụ obodo jiri biri n’ụlọ ezumezu ụlọọrụ ahụ n’Awka.
Oriakụ Ngozi Chilokwu (Deputy Director Administration) n’ozi ọ gụpụtara iji kọwapụta ọrụ ọma niile nke Willie Okafor rụpụtagoro n’ụlọọrụ ahụ n’ime otu afọ kwuru na ya bụ nwoke bụ odogwu, onye maara ihe ekwe na-akụ.
O kwuru na tupu Okafor amalite ịbụ onyeisi ASHDC na ha nwere ihe ịma aka gbasara ala ha nke a kpakọọrọ mana dịka ọ malitere ọrụ ọ gbara mbọ wechighatachaa ala ndị ahụ.
Ọ kọwapụtara mbọ onyeisi ASHDC ahụ gbasara Liberation Estate, Green Valley Estate na ọtụtụ ndị ọzọ.
N’ezie Chilokwu gụpụtara ọrụ ọma odogwu nwoke a dịka aja dị n’ala nke apụghị ịgụta ọnụ.
N’okwu nke ya, Chief Lawrence Ezeudu onye bụ onyeisi (Chairman Hosue Committee on Housing) n’ụlọ nzukọ omebe iwu steeti Anambra kelere aka na-achị Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano maka amamihe ya n’ịhọpụta Willie Okafor dịka onyeisi ASHDC.
Ọ kpọkuru ndị ọrụ n’ụlọọrụ ahụ ka ha kee ajị n’ume iji hụ na ebe obibi ahụ – Liberation Estate nke e gosiri n’onyoonyoo bịara na mmezu.
Ezeudu kwuru sị; “Ana m ekwe ụlọọrụ a nkwa taa na ụnụ na kọmiti m ga enwe ezi mmekọrịta iji hụ na ọ bịara na mmezu maka ọdị mma nke ndị Anambra.
Ama m na ndị Anambra hụrụ ihe dị mma n’anya, ya mere, n’ime ọnwa abuọ ala ahụ (liberation estate) ga-agwụcha. Akwụ m ebe a na-ekwe ụnụ nkwa maka nkwado anyị bụ ndị nọ n’ụlọ nzukọ omebe iwu. Okwuputa okwu (speaker) ma maka ihe niile anyị na ụnụ na-eme.”
Chief Nwofo n’akụkụ nke ya gọrọ ọfọ ndụ ndụ, ihe ọma na uju amara (toast) n’isi Willie Okafor wee kpọghepụ mmanya, ebe ọ bụla bụrụ ańụrị ańụrị.
Ndị ọrụ ASHDC kọwara onyeisi ha na-echeta otu afọ n’ọrụ dịka onye maara ọrụ ya nke ọma, na-eme ọtụtụ ihe n’otu oge ma kwesịkwa ntụkwasi obi.
Ha kwuru na ọrụ ha na ya na-arụ bụụrụ ha ohere ọma dị egwu nke gbanwere ndụ ha. Ndị gbara ama a gụnyere Sampson, Oluebube na Rhoda Onwuachu.
Willie Okafor bụ onye na-echeta otu afọ ya dịka onyeisi ASHDC ji ọńụ nabata ndị mmadụ ma bunye Chineke otito niile.
O kwuru sị; “Site na mbido elekwasara m anya n’obe nke kalvarị. Otito niile dịrị Chineke onye kacha elu. Ama m ihe m chọrọ na ihe m chọrọ ime ebe a. Ana m etinye ya n’aka onye kere ụwa.
Obi siri m ike n’ihi na ama m Chukwu m na-efe. Eze ndị eze, onye na-eme ihe ekweghị omume ka o kwe omume. Anyị amalitela ya bụ njem, anyị ga-emezu ya. Liberation Estate ga-abịa na mmezu. Mụ na Chukwu agbaala ndụ, ama m na ọ ga-emezu nkwa o kwere.”
Okafor gara n’ihu kelee ndị niile nyeere ya aka n’ụzọ dị iche iche. O chefughị ndị ọrụ ya, ọ gwara ha sị; “Ana m ahụ ụnụ niile dịka ụmụ m. Feenụ Chineke site n’ịza oku ọ kpọrọ ụnụ nke bụ ihe anyị na-eme ebe a.”
Ịwa achịcha so n’otu ihe e mere na ya bụ mmemme, ebe ndị enyi, ndị ọrụ, tinyere oriakụ Willie Okafor gbara ya gburugburu, ma soro ya kelee Chineke.
Ndị bịaranụ gụnyere: Hon Patrick Udogba, Hon Eddi Ibouza, Hon Chidi Udeagbana, Ark Godwin Chuks Okoye, Ark Charles Egbudom, Ọkammụta Misherck Umenweke, Engr Eze Anthoy, Hon Afam Udeogalanya, Jeff Maduemene.