E MEELA nnyocha ma chọpụta na Pope Francis ebuteghị ọrịa coronavirus dịka ọ dara ọrịa ma kagbuo aja maasị o kwesịrị ichụ na Rome.
Ndị mmadụ chere echiche na o butela ọrịa ọjọọ ahụ dịka o kwechara aka ma susukwa ndị mmadụ bịara n’ogige (square) mgbe nje ahụ na-agbasa na mba Italy. O kelekwara ndị bishọp bịara njem n’oge ahụ.
Ọ dara ọrịa ahụ oge ọrịa coronavirus cheere Italy aka mgba, ma ọ dịla mma ugbu a.
Na Monde ka ọnụọgụ ndị na-arịa ọrịa ọjọọ ahụ sitere na iri atọ na anọ gbagoo na iri ise na abụọ; ebe ọnụọgụ ndị na arịa coronavirus na mba dị iche iche dị na Europe agafeela puku abụọ.